Nnia Nwodo: Nnamdi Kanu, okwu ọjọọ na ịkọ ọnụ agaghị enye anyị Biafra

Ebe foto si, BBC/Getty Images
Onyeisi otu Ohaneze Ndigbo bụ John Nnia Nwodo dere akwụkwọ ozi oha degara Nnamdi Kanu ma gwa ya na okwu ọjọọ na ịkọ ọnụ agaghị enye Igbo Biafra.
Nke a na-abịa dịka Kanu na ndị otu ya bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) na-ama ndị ndu ala Igbo aka n'ihu.
N'ime akwụkwọ ozi ahụ nke na-emetụ n'obi, Nwodo kwuru na ihe o ji dee ya bụ akwụkwọ ozi bụ iji kwuru ọnụ ya n'ebubo nile ndị Ipob na-ebokarị ya.
Lee ihe 10 gbara ọkpụrụkpụ o kwuru:
1. Aka m adịghị n' Egwu Eke (Operation Python Dance) nke ndịagha Naijiria mere n'ala Igbo n'afọ gara aga.
Abụghị m onye agha nke m na-abụ onyeisi ndịagha.
Mgbe ndịagha kwuru na ha ga-eme Egwu Eke nke abụọ, a katọrọ m ya.
2. Mgbe Nnamdi Kanu hibere otu ọ kpọrọ "Biafra Security Service", e kwurum ka onye ọbụla kpachapụ anya.
Mgbe gọọmentị etiti kpọrọ Ipob otu ndị oyi egwu, a katọrọ m ya nke ukwuu.
3. E degaara m onyeisi ọgbakọ mbaụwa bụ "United Nations" akwụkwọ ma kọwaara ya na Ipob na Massob abụghị ndị ọgbaaghara.
Anaghị m akwado etu niile ndị Ipob si eme ihe mana onweghi mgbe ha ji buru egbe maọbụ mma iji yie ndị mmadụ egwu.

Ebe foto si, Getty Images
4. Ebuuru m okwu gbasara ndị Ipob gaa "Chatham House" na mba Briten ebe m kwuru na ndị Igbo bụ ndị kacha egosi na Naijiria bụ otu.
Mana gọọmentị Naijiria ka na-eme anyị ka ndị mba ọzọ.
5. Ebubo Nnamdi Kanu boro m na m bụ onye na-arụrụ ndị Fulani ọrụ, enweghi isi.
Ana m akatọ Onyeisiala Buhari, mana agaghị m akpọ ya iyi maọbụ kwuo na Naijiria bụ ụlọ ụmụanụmanụ.
6. Nna m rụụrụ Zik na Okpara ọrụ dịka mịnịsta. Nna m so na ndị kwadoro Biafra n'oge agha.
Mụ na onwe m lụrụ agha Biafra oge m bụ okorobịa.
7. Mụ na Odumegwu Ojukwu dịka nwanne na nwanne. Alex Ekwueme bụ ezigbo enyi m.
Nnamdi Azikiwe weere m dịka nwa. Michael Okpara bụ onyeisioche n'oriri agbamakwụkwọ m.

Ebe foto si, AFP
8. Okwu ọjọọ, ịkpọ iyi nakwa okwu nwereike ibute ọgbaaghara, agaghị eme ka e nye anyị Biafra.
E wepụ ịlụ agha, onweghi onye ga-amanye Naijiria n'ike ka e nye anyị Biafra.
Nwayọọ nwayọọ ka e ji aracha ofe dị ọkụ.
9. Okwu gbasara nnwereonwe abụghị ihe taa na echi, Catalonia na Saharawi Arab Democratic Republic bụ ọmụmaatụ.
Ka anyị nwere ya nwayọ, hapụ ọgbaaghara.
10. Ana m akwanyere Nnamdi Kanu ugwu maka na ọ bụ onye obi siri ike. Mana achọrọ m ka onye ọbụla katọọ ya ma o mee nke na-adabaghị adaba.
Nwodo kwuru na ya agbagharala Kanu maka mkparị niile ya na ndị Ipob kparịrị ya, mana ọzọ emezịna.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:









