Dino Melaye ekwuola na ọ ga-azọta oche gọvanọ Kogi state

Ebe foto si, Twitter/ Dino Melaye
Dino Melaye ekwuola sị ụjọ atụla onye ọbụla maka nchutu n'ọkwa sinetọ ụlọikpe chuturu ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
O kwuru sị na nke chere ya n'ihu ka mma, makana o nwere olileanya ịzọta oche gọvanọ Kogi steeti mgbe a ga-eme ntuliaka ọhụrụ.
Ike Ekweremadu agaruola Enugwu

Ndị Enugwu west bụ ndị ọ na-anọchite anya ha n'ụlọomeiwu ukwu nabatara Ike Ekweremadu ka ọ batara Enugwu, ebe ọ nọ kọwaara ha ihe mere ya na mba Jamini.
O kwukwara na ọ gbagharala ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) wakporo ya.
Ndị na-akwado Ekweremadu dọkwara ndị otu Ipob aka na ntị, sị ha anwakwala anwa metụ Ekweremadu aka ọzọ.


Buhari ga-eme njem
Onyeisiala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari ga-aga mba Japan ụbọchị ụka bụ abalị iri abụọ na ise nke ọnwa a, ebe ọ ga-esonye nzukọ gbasara mwulite mba Afrịka nke a kpọrọ "Tokyo International Conference on African Development".
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Nzukọ a bụ nke ugboro asaa a na-eme ya, ga-agwụ n'ụbọchị iri atọ nke ọnwa a.
N'ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Ala eriela David Koch bụ onye nke iri na otu kacha nwee ego n'ụwa.
Koch dị afọ iri asaa na itoolu nwụrụ site n'ọrịa kansa ọ na-arịa kemgbe.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Gịnị ka ị ga-asị Fernando Torres gbabuuru otu egwuregwu Chelsea, Liverpool na Atletico Madrid dịka o koliri akpụkpọụkwụ bọolụ ya?
Cheta na Torres so mba Spen bulie Iko Mbaụwa n'afọ 2010 ma nwetakwa ihe nrite ndị ọzọ dị iche iche.
Dịnụ njikere maka abụbụ ọrụ na-enweghị atụ - NASU na SSANU

Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu "Non Academic Staff Union of Universities" nakwa ndị "Senior Staff Association of Nigerian Universities" ekwuola na ha ga-agba arụkwaghịm nke onweghi onye ma mgbe ọ ga-akwụsị n'oge na-adịghị anya.
Iwe ha bụ na gọọmentị achọghị itinye anya na mkpesa niile ha na-eme, na-agbanyeghi na ha agbabuola abụbụ ọrụ abalị ise iji dọọ gọọmentị aka na ntị.
N'ọgbakọ ndị ntaakụkọ ha nwere ụnyaahụ, osote onyeisi ndị SSANU bụ Solomon Alfa kwuru na gọọmentị etiti na-akpa oke.
O kwuru na anaghị eme ndị NASU na SSANU etu e si eme ndị ogbo ha bụ ndị "Academic Staff Union of Universities" ASUU.
Alfa gara n'ihu kwuo na abụbụ ọrụ ịdọ aka na ntị ha gbaburu ga-ebi tn'ụbọchị Fraịdee abalị iri abụọ na atọ nke Ọgọst.
Mana ndịisi NASU na SSANU ga-enwe nzukọ iji kpebie ihe ọzọ ha ga eme.
Ndị omekome ga-ahụ ịwa n'Enugwu

Gọọmentị Enugwu Steeti nakwa ndị uweojii na steeti ahụ eforola ntutu taa na ha ga-ahụ na anwụchiri onye maọbụ ndị ji mma sugbuo otu nwaanyị dị ime n'ugbo ya n'ụtụtụ Wednesday.
Osote gọvanọ Enugwu bụ Cecilia Ezeilo na onyeisi ndị uweojii steeti ahụ bụ Suleiman Balarabe kwere nkwa a oge ndị obodo Nchatancha mere ngagharịiwe ma nọchie okporoụzọ awara si Enugu gawa Abakiliki.
Ndị omekome na-akpazi nnọọ ajọ ike na mpaghara dị icheiche n'Enugwu.
Cheta na ndị a na-eche na ha bụ ndị ọchịehi gbagburu ndị ụkọchukwu ụka Katọlik abụọ n'ọdịnso a.
A tọrọkwaara onye eze ọdịnala ndị Agbogugu n'okpuru ọchịchị Awgu.
Ọkụ ọgbụgba n'ọhịa Amazon

Ebe foto si, Reuters
N'ofesi, oke ọkụ ọgbụgba n'ọhịa Amazon nke dị na mba Brazil na-enye ndị ọchịchị n'akụkụ ụwa niile isiọwụwa ugbua.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Amazon bụ oke ọhịa kachasị n'ụwa niile nke ndị ọkacha mara kwuru na ọ na-enye aka ibelata ekpomọkụ ụwa nke a akọrọ Global Warming na asụsụ bekee.
Wolves etinyela otu ụkwụ na Europa League

Ebe foto si, EPA
N'egwuregwu, otu egwu bọọlụ Wolverhampton Wanderers nke Ingland ji ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie ndị Torino nke Italy n'asọmpi nke mbu maka itozu iso gbaa asọmpị Europa League nke afọ a.
Agba nke abụọ ga-adị n'abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa a.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:










