Catholic Priest Killing: Etu esi gbuo Fada Paul Offu - Ọnu na-ekwuru ndị Catholic n'Enugwu
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 1
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 2
Ndị fada niile n'Enugwu Diocese mere ngagharịiwe ụbọchị Fraide maka ogbugbu e gburu Fada Paul Offu.
Fada Paul Offu na-aga n'ụlọ Fada ọzọ bụ enyi ya nwoke ya tupu o zute ndị omekome dulaa ya mmụọ na mgbede Tọzde, dịka a gwara BBC Igbo.
Fada Benjamin Achi bụ ọnụ na-ekwuru Ụka Katọlịk n'Enugwu steeti sị na ọ bụ ebe ha nọ nzukọ ndị Fada e mere n'Emene dị n'Enugwu n'ụbọchị Tụsde, ụbọchị mbụ n'ọnwa Ọgọst 2019, ka ozi rutere na Fada nwụrụ.
Ọ sị na ọ bụ n'ụzọ si Ihe gawa Agbụdụ ka mkpamkpa a kpara.
Fada Achi sị na ọ bụ egbe ka e ji gbuo ụkọchukwu a, "ndị a gburu ya gbakanyere egbe ka ọ na-aga n'ụzọ ahụ."
Ọ gakwara n'ihu kwuo na onwebeghi nchọpụta e mere maka ndị kpara ike a.
"Ihe a mere na mgbede ụnyaahụ. Isi juru onye ọbụla, nke mere na onwebeghi onye ma ihe ọ ga-ekwu."
Paul Offu bụ onye Okpatu dị n'okpuruọchịchị Udi n'Enugwu Steeti.
Ọ bụ ukọchukwu na-ahazi ulọụka St James the Greater, dị n'Ụgbawka.

Ọnwụ Fada Offu emeela ya nke ugboro abụọ pụtara ihe a na-awakpo ndị ụkọchukwu Katọlịk n'Enugwu steeti.
N'izuụka ole na ole gara aga ka akụkọ pụtara na ndị omekome gbakanyere egbe n'ụgbọala otu fada, nke merụrụ otu onye nọ n'ime ụgbọala ahụ ahụ.

Fada Achi sị: "Ihe a bụ okwu onye ọbụla na diocese anyị kpụ n'ọnụ. Onye a gbara egbe ka nọ n'ụloọgwụ. E wepụbeghi mgbọ egbe dị ya n'ụkwụ, tupu nke a e mee."
O kwukwara maka onye ụkọchukwu e gburu n'ọnwa Maachị 2019.

Ndị uweojii mechara sị na aka ha kpatara ndị gburu Fada nke nwụrụ n'ọnwa Maachị: Anyị ejidela ndị gburu Fada Clement n'Enugwu - Ndị uweojii
Mana ndị uweojii n'Enugwu sị na ha amabeghi ndị gburu Fada Offu.
Ebere Amaraizu, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu, sị ka a ghara ibo ndị na-achị ehi ebubo na ọ bụ ha mere ihe a, makana ha "ga-eme ihe niile ịhụ na a chọpụtara ndị aka ha dị n'ihe mere ụkọchukwu a."















