Catholic Church: Ụmụnne Fada Clement Ugwu ji anyammiri bụọ ndi gburu ya ọnụ

Ndị ezinaụlọ Fada Clement Ugwu

Ebe foto si, Ezinaúló Ugwu

O meela otu ọnwa achọtara ozu Fada Clement Ugwu ebe ndị ntọ gburu ya tufue ozu ya n'ime ọhịa n'Enugwu, mana ibe akwa na iru uju ka juputara n'obi ụmụnne ya.BBC gara n'Ibite Uwenu,Awhum dị n'Enugwu steeti bụ obodo Fada Clementi Ugwu.

Maazi Patrick Egbujie Ugwu bụ diọkpara ezi-na-ụlọ ndị be Ugwu n'Awhum kwara akwa nke ukwuu oge ọ na-echeta ka ndị ntọrị siri gbuo nwanne ya nwoke Fada Clement Ugwu, onye bụ ọdụdụ nwa n'etiti ụmụaka iri nne na nna ha mụrụ.

Ndị ezinaụlọ Fada Clement Ugwu

Ebe foto si, Ezinaụlọ Ugwu

Mazi Egbujie Ugwu ji anya mmiri kwuo na ndị niile kpara nkata gbuo nwanne ya Clement abụrụla ndị abụrụ ọnụ.Nwanne Nna Clement bụ mazi Leonard Ugwu kwuru na ogbugbu ndị omekaome gburu Fada Clement Ugwu bụ ihe mgbawa obi kacha wee wute ezi-na-ụlọ a , were kwue na ha chọrọ ihụ isi ihe mere ndị gburu Clement jiri kpaa arụ ahụ.

Patrick Egbujie Ugwu
Nkọwa foto, Maazi Patrick Egbujie Ugwu bụ diọkpara ezinaụlọ ndị be Ugwu n'Awhum, Enugwu steeti

Ndị Awhum ka nọ n' iru uju maka ọnwụ Clement Ugwu, nke na ọtụtụ mmadụ ka na-abịa n'ụlọ ha maka ọnọdụ omenala iru uju.Fada Clement Ugwu bụ onye amụrụ na Ibite Uwenu n'Awhum, Enugwu Steeti, ebe ọ bụ nwa nke iri nna ya bụ Catechist mụtara.Ochiri ụkọchukwu katọliki na afọ 2010.

Ugwu

Fada Clement onye ndị mmadụ na etu"Rapụlụchukwu okwu" zutere ọnwụ ya na parish ya bụ St. Marks Obunofia dị n'Ezeagu, oge ndị ntọrị tọrọ ya ma gbagbue ya.Ahụzrị ozu Fada Clement Ugwu n'ime ọhịa ebe orerichara ka out izu uka gachara.

Mbara ezịnaụlọ Ugwu

Bishop Callistus Onaga nke Enugwu Diocese du ndị ụka nakwa ndị echichi ibe ya kwanyere ya ugwu ikpeazu na March 21 ma donye ya n'ili na Holy-Ghost Cathedral, Enugwu.Ndị uweojii n'Enugwu ekwola na ha anwụdela ndị ọjọọ gburu Fada Clement Ugwu.