Kidnapped RCCG pastors: Anyị azọpụtala ha niile

Ebe foto si, AFP
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ogun Steeti bụ Abimbola Oyeyemi gwara BBC na ha azọpụtara ndị ụkọchukwu ise ndị omeokome tọọrọ ụnyaahụ bụ Fraịde.
Maazị Oyeyemi ekwughi etu ha si mee ya bu nzọpụta mana ọ sị na ha na esosi ụzọ ọkwụ ndi kpara ike a.
Cheta na ndị uweojii Ogun steeti agbara ama maka ntọrọ emere ndị ụkọchụkwụ ahụ si Abia steeti na-aga Legọs.
Ndị erola nso na Legọs oge ndị omekome ji egbe wakporo ụgbọ ha ma tọọrọ ha.
Ndị uweojii nyere aha ha dịka Chidioze Eluwa, Chiemela Iroha, Okoro Ohowukwe, Ndubuizi Owuabueze, na Ibeleji Chidinma bụ naanị nwaanyị so na ndị ahụ.
BBC Igbo ghọtara na ndị ụkọchukwu ahụ na-aga ọgbakọ kwa afọ nke ndị ụka ahụ na enwe n'ọnwa Ọgọstụ afọ ọbụla n' ogige ha a kpọrọ 'Redemption Camp' dị na Mowe Ogun steeti.
Otu ụkọchukwu ụlọụka gwara onye ntaakụkọ BBC na onyeisi ụka 'Redeemed Christian Church of God' bụ Enoch Adeboye kwupụtara nke n'ọgbakọ ha n'ụtụtụ tata ma kpọọ oku ka ha kpere ha ekpere.
Ka ọ dị ugbua, onyeisi ndi uweojii na Naijiria bụ Mohamed Adamu enyela ndị orụ ya iwu ka achọta ma gbapụta ha.










