Boko Haram insurgency: Meenu nnyocha maka ndịagha 1000 e liri na nzuzo – Atiku

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Akụkọ ndị dị mkpa 1/8/2019:

Atiku: Meenu nnyocha maka ndịagha 1000 e liri na nzuzo

Atiku Abubakar na Ndịagha Naijiria

Ebe foto si, Getty Images

Onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019 n'aha pati PDP bụ Atiku Abubakar akatọọla olili a na-ebo na e liri ndịagha nwụrụ na ọgbọ ọgụ Boko Haram na nzuzo.

Ụlọakụkọ 'Wall Street Journal' wepụtara akụkọ nke na-ebo ebubo na e liri ihe ruru ndị agha dị otu puku n'ogige ndị agha dị na Maidguri, Borno steeti iji gbuchie ihe ibu agha megide Boko Haram rierela Naijiria.

N'ozi ya n'igwe Twitter ya, Atiku onye kwuru na ọ bụ' ihe mgbawa obi izoro lie ndịagha nwụrụ na agwaghị ezinaụlọ ha,"ma kpọ oku ka e hiwe kọmịtị abụghị nke gọọmenti nke ga-enyocha ebubo ahụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

N'akụkọ ahụ nke Wall Sttreet Journal dere, otu onye agha akpọghị aha ya kwuru na : "E liri ọtụtụ ndị otu anyị n'ili n'abalị."

"Ọtụtụ na-anwụ nke a na-eme ka ọ dị ka ha abịaghị ụwa."

Ndị dọkịta ewepụtala eze karịrị 500 n'agba otu nwata

Nwata e wepụtara eze 525 n'ọnụ
Nkọwa foto, Nwata e wepụtara eze 525 n'ọnụ kwuru na agba na-afụ ya ụfụ

Ndị dọkịta na mba India ewepụla ihe karịrị eze narị ise na ọma n'ọnụ otu nwata nwoke dị afọ asaa.

Nwata e wepụtara eze 525 n'ọnụ
Nkọwa foto, Nwata e wepụtara eze 525 n'ọnụ kwuru na agba na-afụ ya ụfụ

Ha chọpụtara nke a dịka nwata ahụ gara ụlọọgwụ n'afọ gara ebe agba ya na-egbu ya mgbu ma koo eko.

Ụfọdụ eze ndị a wepụtara n'ọnụ nwata ahụ
Nkọwa foto, Ụfọdụ eze ndị a wepụtara n'ọnụ nwata ahụ

Igwe nyocha bụ 'X-ray' gosiri ihe dị ka anụ ahụ ebe eze karịrị narị ise dị n'eze nwata ahụ.

Ha wara nwa ahụ ọnụ n'ihe ruru elekere ise tupu ha enweike weputa eze ndị ahụ.

Lee ya n'ihe nkiri a:

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Chukwueze esonyerela otu 'Roc Nation Sports'

Chukwueze ebinyela aka n'akwụkwọ isonyere Roc Nation Sports

Ebe foto si, Twitter/Roc Nation Sports

Nkọwa foto, Chukwueze ebinyela aka n'akwụkwọ isonyere Roc Nation Sports

Nwaafọ Igbo bu Samuel Chukwuezu nọzị mma na-ekwe oyooyoo ugbua dịka o sonyeerela ụlọọrụ 'Roc Nation Sports.'

Roc Nations Sports bụ nnukwu ụlọọrụ na-elekọta ndị egwuregwu dị icheiche nke onye nwe ya bụ otiegwu a ma ama aha ya bụ Jay Z.

Ụlọọrụ ahụ kwupụtara nke a n' akara Twitter ha ụbọchị Tọzde, na-eto Chukwueze dịka otu n'ime ndị ntorobịa bụ ọkacha agba bọọlụ na mba Afrịka.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ka ọ dị ugbua, Chukwueze esonyerela ndị dịka Romelu Lukaku na Eric Bailly nke otu egwu Manchester United dịka ndị ụlọọrụ ahụ na-elekọta anya.

APC apịachiela akwụkwọ n'ụlọikpe

Muhammadu Buhari na Yemi Osinbajo

Ebe foto si, Twitter/Bayo Omoboriowo

Nkọwa foto, Onyeisiala Muhammadu Buhari na osote ya bụ Yemi Osinbajo

Akụkọ sị Abuja pụta taa kwuru na ndị otu APC akpọghị onye akaebe ọbụla n'ikpe dị n'etiti Muhammadu Buhari na Atiku Abubakar gbasara onye meriri ntuliaka nke 2019.

Cheta na Atiku na ndị otu ya bụ PDP gbara Buhari na ndị APC akwụkwọ na-ebo ha ebubo nrụrụaka na ya bụ ntuliaka e mere n'ọnwa March.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ

Obi adịghị Okorocha mma

Owele Rochas Okorocha

Ebe foto si, PIUS UTOMI EKPEI

Nkọwa foto, Okorocha kwuru na naanị ihe Ihedioha chọrọ bụ ka ọ metọọ aha ya.

Aka chịburu Imo Steeti bụ Rochas Okorocha agbarụọla ihu maka mweghara gọọmentị Imo weghaara 'Eastern Palm University' nke bụ otu n'ime mahadum ọ rụrụ tupu ọ rituo n'ọchịchị.

Kọmiti nke gọvanọ Emeka Ihedioha hibere gbasara nkea kwuru na Imo steeti enweghị ego iji lekọta imirikiti mahadum nke Okorocha sị na o rụrụ oge ọ bụ gọvanọ.

Ọrịa Ebola ka na-agbasakwa

Oke ala dị n'etiti Rwanda na Congo DR

Ebe foto si, Reuters

N'ofesi, mba Rwanda emechiela oke dị n'etiti ha na mba Congo n'ihi egwu na ọrịa Ebola nwere ike ịbata n'obodo ha.

Nke a mere dịka a chọpụtara onye nke atọ nwere ọrịa Ebola na mpaghara Goma bụ Obodo ya na Rwanda nwere oke ala.

United Nations: Mmadụ 27,000 anwụọla n'afọ iri Boko Haram kpaarala ike

Ogige ebe ndị gbara ọsọ ndụ
Nkọwa foto, Ogige ebe ndị gbara ọsọ ndụ n'Ọdịdịda-Anyanwụ Ugwu, Naijiria.

Otu United Nations ekwuola na nsogbu Boko Haram ataala isi opekata mpe mmadụ n'afọ iri ha merela mkpamkpa n'Ọdịdịda-Anyanwụ Ugwu, Naijiria.

UN kwuru nke a n'ọgbakọ ha na ndị otu ndị ọzọ na-enyere mmadụ nkwado mere na Abuja iji tulee ihe merela n'afọ iri ndị Boko Haram kpara ike.

Ha nọrọ ebe ahụ kwee nkwa ị ga-n'ihu ịkwado ndị gbara ọsọ ndụ n' Borno,Adamawa na Yobe steeti.

Aha onyonyo, Boko Haram Widow: Ọ dị m ka ọkụ ndụ m nyụrụ mgbe di m nwụrụ

UN gbara ama ọgụ ndị Boko Haram emebichala ọtụtụ dị na steeti ndị ahụ, ebe ha tọọla ọtụtụ ụmụaka ụmụnwaanyị ndị ha jiri mee nwunye na ndị na gbara ha ogbunigwe, ma manye ndị nwoke ka ha ghọọ ndị agha ha.

Boko Haram ka na-akpa ike na Naijiria na-agbanyeghị na gọọmenti etiti ekwuola na ha ekwopụla ha mpi.

Nwa Osama Bin-Laden alakwurula nna ya

Hamza Bin Laden

Ebe foto si, CIA

Nkọwa foto, Cheta na gọọmentị mba Amerịka tụkwasịrị otu nde dọla n'isi ya maka onye nwere ike ịgba ama maka ebe ọ nọ

Akụkọ si mba Amerịka pụta na-akọwa na Hamza Bin-Laden bụ nwa nwoke onye bụbu onyeisi al-Qaeda bụ Osama Bin-Laden anwụọla.

Mana ha sị na ebe ọ nọ nwụọ maọbụ mgbe ọ nwụrụ edoghị anya.

Etu o si nwụọ edokwaghị anya, mana ntị ndị mmadụ tọrọ n'ala ịnụ akụkọ so ya.

Dangote emezuola nkwa o kwere Super Eagles

Aliko Dangote

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Aliko Dangote bụ onye nwe Dangote Cement na ụlọọrụ ndị ọzọ dị iche ichedịka ndị ọgaranya ndị ọzọ na-eme

Aliko Dangote emezuola nkwa o kwere Super Eagles ịkwụ ha puku dọla iri ise ($50,000) maka goolu ọbụla ha nyere n'egwuregwu ọkara-ikpeazụ.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Ndị Ọljiria mechara jiri 2-1 gbapụ Naịjirịa, n'agbanyeghi na Naịjiria nwetara otu goolu si n'ụkwụ Ighalo.

Cheta na Dangote na Femi Otedola so na ndị ọgaranya Naịjirịa a na-anụ aha ha, kwere ndị otu egwu bọọlụ Naịjirịa nkwa ego ka ha gara asọmpi Iko Mba Afrịka nke afọ 2019.

Ihe Umahi kwuru maka ndị nkuzi,

Dave Umahi

Ebe foto si, EBONYI GOVERNMENT

Aka na-achị Ebonyi steeti bụ Dave Umahi, etinyela iwu iji machie ntụfe ndị nkuzi site n'otu okpuruọchịchị gafee okpuruọchịchị ọzọ.

O kwuru nke a ka ọ na-akọwa na ebe ọ bụ na okpuruọchịchị obodo enwerela onwe ha n'ihe gbasara ego, na ha ga-akwụkwara onwe ha n'ihe gbasara ụgwọ ọnwa ndị ọrụ.

Naịjirịa na-atụbata ọgwụ 70%

Ụlọọrụ ndị Nafdac

Ebe foto si, NAFDAC official Facebook

Nkọwa foto, Ndị Nafdac machiri ụlọọrụ anọ maka nchọpụta BBC mere maka etu ndị mmadụ si emebi ọgwụ ụkwara nwere codeine ha na-arụpụta

Ngalaba na-ahụ maka nchekwa nri na ọgwụ a kpọrọ NAFDAC ekwuola na Naịjirịa na-atụbata ọgwụ n'ogo ruru ụzọ asaa n'ime ụzọ iri.

Mana onyeisi ha bụ Mojisola Adeyeye gara n'ihu dụọ ndị na-arụpụta ọgwụ na Naịjirịa ọdụ, kwuo ka ha gbaa mbọ hụ na ha meziri nke ha na-arụpụta ọfụma.

N'egwuregwu,

A nyụkọọ mamịrị ọnụ ọ gbaa ụfụfụ; nke a ka Andy Murray na Jamie nwanne ya nwoke gosiri dịka ha meriri n'egwuregwu tenis nke Washington Open.

Jamie na Andy Murray

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ike Jamie na Andy Murray kpara ka ha nọkọrọ ọnụ pịa asọmpi Iko Davis nke mba Briten, nyere ha mmeri n'afọ 2015

Nke a bụ mbụ ha abụọ na-eso apịa tenis kemgbe afọ 2016.

Akụkọ BBC Igbo na nkeji:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Boko Haram Widow: Ọ dị m ka ọkụ ndụ m nyụrụ mgbe di m nwụrụ