Samuel Chukwueze: UEFA ahọpụtala ya n'ime ntoroọbịa 50 a ga-elebara anya n'Europe

Samuel Chukwueze

Ebe foto si, Samuel Chukwueze/Instagram

Otu na-elekọta egwu bọọlụ na Yurop bụ "Union of European Football Associations (Uefa)" ahọpụtala Samuel Chukwueze nke Super Eagles n'ime ndị na-etolite etolite ụwa niile kwesịrị ilebara anya.

Chukwueze dị afọ iri abụọ (20) na-agbara otu egwu Villarreal bọọlụ, ka ọba ozi ndị Uefa gbara afa na o so na ndị a na-atụ anya ga-eme nke ọma n'afọ egwuregwu nke 2019/2020.

Ya bụ nwaamadị so Super Eagles nke Naịjirịa gbaa asọmpi Africa Cup of Nations (Afcon) nke 2019 n'Ijipt, ebe o so ha nata ọlanchara ka ha gbara ndị nke atọ.

Ka ọ na-agbara Villarreal, Chukwueze enyerela ndị otu ha aka site na inye goolu ise n'asọmpi iri abụọ na isii ọ gbarala.

Uefa kwuru na ha tụrụ anya na Chukwueze ga-eme karịa ka ọ mere n'ọdịnihu.

Ndị ọzọ a gụpụtara aha ha na ya bụ ọbaozi gụnyere Yunus Akgün (TUR, 19 - Galatasaray), Benoît Badiashile (FRA, 18 - Monaco), Rhian Brewster (ENG, 19 - Liverpool) na ndị ọzọ.

Chukwueze bidoro egwu bọọlụ ya n'otu Diamond Academy ma sorokwa nye otu goolu n'ime goolu abụọ Super Eagles ji merie Saụt Afrịka n'asọmpi Afcon nke 2019.

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, International Women's Day: 'A naghị akwado bọọlụ ụmụnwaanyị ọfụma'

Akụkọ ga-amasị gị