Ayatollah Khamenei: Ihe mere Afrịka ji akpachapụ anya n'ihe na-eme ugbua

Ndị na-eme ngagharịiwe na-aga ije n'ahịrị ma yiri uwe oji ma jiri ọkọlọtọ mba Iran nakwa foto onyendu kachasị elu na Iran e gburu egbu, Ayatollah Khamenei.

Ebe foto si, Islamic Movement of Nigeria (IMN)

Nkọwa foto, Ndị na-eru uju na Naịjirịa na-eme ngagharịwe make ogbugbu egburu onyendu kachasị elu na Iran bụ Ayatollah Khamenei na mwakpo Amerịka na Izrel jikọtara aka ọnụ mee na Tehran.
    • Onye dere ya, Makuochi Okafor
    • Onye dere ya, Chris Ewokor
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ogbugbu e gburu onyendu kachasị elu na mba Iran bụ Ayatollah Ali Khamenei na mwakpo mba Amerịka na Izrel jikọtara aka ọnụ wakpoo Iran akpaliela nnukwu okwu na mpaghara Afrịka.

Ndị ọchịchị na otu ndị okpukperechi dị iche iche etinyela ọnụ iji gosi mmekọ dị n'etiti ha na Iran.

Kedụ ihe jịkọrọ mba Iran na Afrịka? Mba Iran kemgbe ọgụ afọ iri, etinyela ego n'ihe gbasara ogige okpukperechi, agụmaakwụkwọ n'efu nakwa ihe gbasara omenaala na mba ndị gunyere Naịjirịa, Niger, Ghana na Gambia.

N'ihi nkea, ihe ọbụla mere na Tehran, anaghị emetụta sọsọ na 'middle east' mana ebe ndị ọzọ nke Afrịka sọ na ya.

Ngagharịiwe a na-eme na Naịjirịa nakwa Niger gosiri na mba Iran gbara mgbọrọgwu n'Afrịka.

Naịjirịa bụ ebe e nwere ọnụọgụgụ kachasị elụ ndị otu okpukperechi Alakụba nke a kpọrọ Shiite

Ndị otu a mere ngagharị na steeti iri na abụọ dị na mpaghara ugwu Naịjirịa maka iru uju ọnwụ Khamenei mana ndị ọchịchị Naịjirịa dọrọ aka na ntị na ha ga-emesoo onye ọbụla chọrọ ịkpalite ọgbaaghara maọbụ esemokwu maka ihe na-eme n'Iran.

Otu onye a ma ama na ndị ọtụ shitte ma bụrụkwa onyeisi ụlọọrụ mgbasaozi ndị ụka, Ibrahim Musa kwuru na ndị na-eso nzọmụkwụ Khamenei na-ahụta ya dịka onye "nduzi okpukperechi nakwa nduzi ime mmụọ", nke ndị mmadụ tụkwasịrị obi nke ukwuu.

Ọkammụta Isah Mshelgaru, onye Naịjirịa na-akwado ikike dịrị mmadụ gbasara okpukperechi Shia kọwara ọnwụ Khamenei dịka "ihe ụfụ".

Foto ụmụnwaanyị na-eme ngagharịiwe yi uwe ma jiri akwụkwọ foto onyendu ndị Shiite na Naịjirịa bụ Ibrahim Zazaky n'aka nke edere 'hapụ Zakzaky'

Ebe foto si, AFP via Getty Images

Nkọwa foto, Ndị Iran na ụmụakwụkwọ Naịjirịa ji akwụkwọ foto onyendu ndị Shiite Ayatollah Ibrahim Zakzaky mgbe ha na-eme ngagharị n'ezi ụlọọrụ nnọchiteanya Naịjirịa dị na Tehran abalị iri na asaa nke ọnwa Julaị afọ 2019. Zakzaky nọ n'ụlọmkpọrọ kemgbe Disemba afọ 2015 mgbe ndị nchekwa gburu ọtụtụ ndị na-eso ya nke gúnyere ụmụnwaanyị na ụmụaka dịka ụlọọrụ 'rights watchdogs' si kwuo. Zakzaky na ndị ọchịchị Naịjirịa nọ na esemokwu kemgbe ọgụ afọ maka okwu ọ kpọrọ maka mgbanwe alakụba ụdị nke Iran na-eme na Naịjirịa.

Ibrahim Zakzaky, bu onye kwudobere otu Alakụba na Naịjirịa bụ 'Islamic Movement in Nigeria' (IMN) mgbe emechara mgbanwe ọchịchị n'Iran n'afọ 1979.

Nkea na-egosi njikọ etu ndị otu Shiite na Naịjrịa si mmụba ma nwe njikọ.

Dịka otu onye nwere agụmaakwụkwọ gbasara nchekwa n'ụlọọmụmụ 'Washington Institute nakwa ụlọakwụkwọ Tel Aviv, Omer Carmi si kwuo, e nwere mgbe onyendu kachasị elu nke Iran kpọpụtara Ibrahim Zakzaky nakwa otu ọ na-edu.

Mkpọpụta ahụ gara n'ihu gosipụta na otu ahụ bụ njikọta sara mbara nke Iran na ọnụnọ ha n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka.

Ọkammụta Sufi Atif Amin Al Hussaini na mba Gambia ebe Shia nwere nguzobe, kọwara Khamenei dịka onyendu dị mma ma katọọ mwakpo Izrel na Amerịka na-eme n'Iran.

E mere ngagharịiwe na mba Niger maka ogbugbu Khamenei mana gọọmenti Naịjirịa na Niger enwebeghị ihe ha kwuru maka nke a.

Mba Burkina Faso ekwupụtala mmechi ụlọọrụ nnọchiteanya mba Amerịka

Gọọmenti Burkina Faso katọrọ mwakpo ahụ ma kwupụta mmechi ụlọọrụ nnọchiteanya mba Amerịka dị na Ouagadougou.

Ha gara n'ihu kpọghachite onye nnọchianya ha nọ n'isi obodo Amerịka bụ Washington.

Cheta na Burkina Faso, Mali na Niger ebelatala mmekọrịta ha na mba ndị dị n'ebe Ọdịda Anyanwụ n'afọ na-adịbeghị anya.

Ogbugbu e gburu Khamenei emeela ka okwu gbasara mba ịkwụrụ onwe ha malite ọzọ.

Mba Senegal tinyere ọnụ ma kwuo n'ihe na-eme ugbua "dị njọ"

Praịm minista mba Senegal bụ Ousmane Sonko bụ otu n'ime onye ndu n'Afrịka tinyere ọnụ n'ihe na-eme n'Iran.

Ọ kọwara ogbugbu e gburu ndị mmadụ dịka 'ihe dị oke njọ'.

N'okwu ya, "n'ime ụbọchị abụọ ugbua, agha adaala na mpaghara 'middle east' ka mba "Amerịka na Izrel jikọtara aka mwakpo Iran.

Nkea dị njọ. Iwakpo mba ndị ọzọ iji kwuputa atụmatụ iweghara mba ahụ. Iwakpo mba ọzọ na-ewetaghị nkwado otu mba ụwa bụ 'United Nations' bụ nke dị njọ'.

Saụt Afrịka na Kenya

Otu nwaanyị yi uwe ojii ma kpuru okpu dị oji na ọcha ma welite aka ya elu. Ndị na-eme ngagharịiwe guzo ya n'azụ ma jiri akwụkwọ dị iche iche n'aka nke gụnyere foto onyendu Iran kachasị elu e gburu egbu, Ayatollah Khamenei.

Ebe foto si, AFP via Getty Images

Nkọwa foto, Onye na-eme ngagharịiwe ji foto onyendu kachasị elu n'Iran nwụrụ anwu Ayatollah Ali Khamenei dịka ndị mmadu na-eme ngagharị n'ụlọnnọchịanya Amerịka dị na Durban n'abalị atọ nke ọnwa Maachị afọ 2026. E gburu Khamenei mgbe Amerịka na Izrel mere mwakpo na Tehran.

Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa katọrọ mwakpo Amerịka n'Izrel mere na Iran ma kwuo na mba abụọ esoghi iwu mba ụwa.

"Ịtụ anya nchekwa onwe abụghị nke iwu mba ụwa na-ekwe. Igbochi onwe abụghị nke mmadụ na-atụ anya"

Ọ kpọrọ oku ka mba ndị na-eme mwakpo kwụsị.

Onyeisiala Kenya bụ William Ruto sokwa katọọ mwakpo ahụ a na-eme na mpaghara 'Middle East' ma dọọ aka na ntị na ya bụrụ na nsogbu a gbasaa ma mụbaa na mba ndị ọzọ nọ na mpaghara ebe ahụ, mba ụwa nwereike ị nọ n'ihe ize ndụ.

Na mpaghara Afrịka, ọtụtụ ndị mmadụ ekwuola ihe dị iche iche gbasara ihe na-eme n'Iran karịsịa dịka Iran na-emegwara mwakpo emere ha.

Maka ọtụtụ ndị nọ na mpaghara Afrịka, nsogbu a na-apụta na 'Middle East' abụghị naanị esemokwu dị anya, kama ọ bụ oge na-emetụta nguzogide na njirimara okpukperechi - ihe ndị gosipụtara ụdịrị ndụ Ayatollah Ali Khamenei biri.