Mwakpo ndị ọrụnchekwa n'obodo anyị eriela isi ọtụtụ mmadụ - Ndị Amasiri n'Ebonyi

Udechukwu Oko, gbara afọ 31, onye ogbe Amauzu Ezeke Amasiri bụ onye nwụrụ n'aka ndị nchekwa nwụchiri ya na okorobịa atọ ndị ọzọ, dịka ndị ezinaụlọ ya si gwaa BBC Igbo.

Ebe foto si, BBC/Oko Family

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị obodo Amasiri dị n'Okpuru Ọchịchị Afikpo ,Ebonyi steeti etiela mkpu banyere ihe ha kpọrọ 'mkpagbu' nke gọọmentị steeti ahụ dịka ndịagha weghara ọnọdụ n'obodo kemgbe otu ọnwa.

Ihe ruru mmadụ 10 anwụọla dịka ndị ọrụ nchekwa weere ọnọdụ n'obodo Amasiri kemgbe abalị 31 nke ọnwa Jenwarị afọ 2026, dịka ndị obodo Amasiri si gwa BBC Igbo.

Osote Onyeisi otu Amasiri Town Union gwara BBC igbo sị, "Ụfọdụ bụ ndị agha tigburu, ụfọdụ bụ ndị a gbagburu, ndị amaghị ndị ha bụ a tọgburu otu nwoke abalị ole na ole gara agaa, ụfọdụ nwuru n'ọrịa nihi na emechiri ụlọọgwụ, "

Nke a na-abịa dịka ọrụ nchekwa weghara ọnọdụ n'Amasiri kemgbe ngwụcha ọnwa Jenụwarị afọ 2026.

"Agụu egbuola ndị mmadụ, ndị mmadụ anaghị aganwu ahịa, ha na-agalị ugbo. "

"Ọ bụ eziokwu na anyị na obodo anyí ịna ha gbara agbataobi nwere esemokwu, mana Gọvanọ mee nnyocha mara ihe mere."

" Onweghị ebe ndị Amasiri gbakọrọ kpebie si gaa

"Ihe na-ewute anyị bụ etu o siri tinye mmachi, mechie ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ mechie ahịa, o nweghị onye na-agagharị kemgbe ihe karịrị otu ọnwa n'obodo anyị ugbua."

A na-ebo ebubo na Udechukwu Oko, gbara afọ 31,onye ogbe Amauzu Ezeke Amasiri nwụrụ n'aka ndị nchekwa nwụchiri ya na okorobịa abụọ ndị ọzọ

Ebe foto si, BBC/Oko Family

Nkọwa foto, A na-ebo ebubo na Udechukwu Oko, gbara afọ 31,onye ogbe Amauzu Ezeke Amasiri nwụrụ n'aka ndị nchekwa nwụchiri ya na okorobịa abụọ ndị ọzọ, dịka ndị obodo ha si kwuo

N'abalị 29 nke ọnwa Jenụwarị ndị bu egbe a maghị ndị ha bụ wakporo obodo Oso Edda, dị n'Okpuru ọchịchị Edda, gbuo mmadu ise, tọọrọ ọtụtụ ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ.

Gọvanọ Steeti ahụ bụ Francis Nwifuru kwụsịrị ndị jị ọkwa ọchịchị na gọọmentị si Amasiri ọrụ nwa mgbe nta ma nye iwu ka ndị obodo Amasịrị bụ ebe a na-enyo na ndị kpara mkpamkpa ahụ wepụta ndị mere ya bụ ihe.

Mana ndị Amasịrị na-ekwu na Gọvanọ Nwifụrụ mara ha ikpe ma na-ata ha ahụhụ na-emeghị nnyocha zuru oke iji mata ndị mere ya bụ ihe n'ezie.

Ahịa Amasiri

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Ahịa Amasiri azụbeghị kemgbe otu ọnwa

Okwudi Udechukwu Oko, gbara afọ 31,onye ogbe Amauzu Ezeke Amasiri bụ onye nwụrụ n'aka ndị nchekwa nwụchiri ya na okorobịa atọ ndị ọzọ, dịka ndị ezinaụlọ ya si gwaa BBC Igbo.

Nwunye ya bụ Comfort Udechukwu gbara afọ 27 gwara BBC Igbo sị, "N'abalị 19 nke ọnwa gara aga(Febụwarị), ọ nọ n'Ahịa Akaeze oge ndịagha bịara nwuchie ya kpụrụ ha gawa Abakaliki."

"Ka ọ gachara abalị ole na ole, anyị nwetara ozi na e tigburu ya."

Oge a kpọtụrụ ya n'ekwentị, Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ bụ Iheuwa Omabe gwara BBC Igbo ka onye anyị oge iji zaa ajụjụ a jụrụ ya.

Ihe Ndịuweojii Ebonyi kwuru

Ndị uweojii Ebonyi kwuru na ha amaghị maka ọnwụ nwoke ahụ a sị egburu nke ha na-anụ maka nwoke a tọgburu.

Ọnụ na-ekwuru ha bụ Joshua Ukandu gwara BBC Igbo n'ekwentị na " jụrụ na-eneghị mgbagha ọbụla na onweghị onye ọmasiri nwụrụ n'aka ndị uweojii nna nnyocha okwu dapụtara n'etiti ndị Amasiri na ndi Okporojor."