Ụjọ ogbunigwe ekweghi anyị pụta n'ezi - Ụmụafọ Naịjirịa bi n'Izrel akọwaala ihe ha na-agabiga

Aha onyonyo, Egwu ogbunigwe ekweghi anyị pụta pụta n'ezi - Ụmụafọ Naịjirịa bi na Izrel
Ụjọ ogbunigwe ekweghi anyị pụta n'ezi - Ụmụafọ Naịjirịa bi n'Izrel akọwaala ihe ha na-agabiga

Ụmụafọ Naịjirịa bi na mba Israel ekwuola ihe ha na-agabiga kamgbe ogbunigwe malitere ịda na mba ahụ n'ihi agha ha na Amerịka na-ebu megide mba Ịran.

Otu nwaanyi onye Naijiria bi na obodo Bnei Brak na mba Israel bụ Lovelyn Chidi gwara BBC Igbo ya na di ya na-agba ọsọ ndụ ha kamgbe ụbọchị 27 Febụwarị a malitere izi ha ozi na ogbunigwe mba Ịran adawala n'Izrel.

"Ha gwaburu anyị dị njikere na ọgụ nwereike ịda, mana anyị amaghị na ọ dịla nso. Ọ bụ n'ụbọchị 27 Febụwarị ka e zipuru ozi "ịdọ aka na ntị" sị onye ọbụla gbara ọsọ gawa n'okpuruala 'bunker' iji gbanahụ ogbunigwe ndị ahụ Ịran na-atụbata.

"Anyị niile gbabara ebe ahụ. Mana kamgbe ahụ anyị na-agbazi ọsọ ahụ ihe dịka ugboro anọ kwa ụbọchị. Anyi na-ehikwa ụra n'okpuruala ahụ."

Lovelyn kwara arịrị na ịgba ọsọ agha ahụ edoghị ya na dị ya anya ma kwuo na ha chọrọ ịlọghachị na Naịjirịa ngwa ngwa.

"Ọ bụ ihe mwute na di m ejighi ahụ mana m na-edu ya agba ọsọ ahụ. Anyị agbaala mbọ ịhapụ obodo Izrel mana o nweghi ugbọelu na-abata maọbụ pụọ apụ."

Ọ gara n'ihu kwuo na ụmụ Naịjirịa nakwa ndị Afrịka ndị ọzọ na-ata ahụhụ ugbua maka na ha enweghi ike sinwuo nri dịka n'ihi ọsọ ha na-agba oge niile.

"I nwere ike sinye nri n'ọkụ, ekwe ahụ akụọ, maọbụ ozi abịa n'ekwentị gị ma bịakwa dịka opi 'sireen' tupu ọsọ amalite.

"Anyị na-ahụkwa amụma ogbunigwe ahụ ka ọ na-agafe n'elu mana anyị amaghi ebe ọ na-ada"

Cheta na ọgụ a Amerịka na Izrel na-ebuso Ịran malitere oge Amerịka tụrụ ogbunigwe n'ebe mba Iran na-arụpụta ognunigwe nuklịa, ma gaa n'ihu gbuo onyendu ha bụ Ayatollah Ali Khamenei na mmadụ iri anọ ọzọ welitere isi n'ọchịchị mba Ịran.