Ayatolla Khamenei: Ihe ndị nile ị kwesịrị ịma maka mwakpo Amerịka na Izrel tara isi onyendu Iran

Ayatolla Khamenei

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọọrụ na-ahụ maka mmekọrịta Iran na mba ndị ọzọ ekwuola na a ga-akpọpụta aha onye ga-anọchi Ayatolla Ali Khamenei n'otu abalị maọbụ abụọ na-abịa.

Na mkparịtaụka Minista na-elekọta mịnịstrị ahụ bụ Abbas Araghchi na ụlọntaakụkọ Al-Jazeera nwere, o kwuru sị, "dịka Khamenei nwụrụ, e nwere ịhọpụta onyeisi ọhụrụ n'otu abali maọbụ abụọ na-abịa".

Okwu a na-abịa dịka gọọmentị Iran kwuru na ahọpụtala onyendu nwa mgbe nta bụ onye ga-eji ọkwa ganye oge ruo mgbe onye ndu ọhụrụ ga-abata.

Ọ gara n'ihu kwuo na mwakpo Iran mere bụ iji zọọro onwe ya nakwa ịbọ ihe Amerịka mere anyị."

Mmadu itoolu anwụọla n'izrel dịka Iran zaghachiri mwakpo Izrel na Amerịka jikọrọ aka wakpo ha

Iran tụrụ ogbunigwe n'Izrel

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Iran tụrụ ogbunigwe n'Izrel iji bọọ mwakpo Izrel na Amerịka jịkọrọ aka mee n'obodo ha

Mmadụ itoolu anwụọla na Izrel dịka Iran malitere iwakpo mpaghara 'Middle East' n'ịbọ mwakpo Amerịka na Izrel jikọrọ aka wakpoo mba ha nke butere ọnwụ onye ndu ha bụ Ayatolla Khamenei.

Iran bidoro iwakpo akụkụ Ọwụwa Anyanwụ nke mpaghara 'Middle East'.

Ndị ntaakụkọ mpaghara sị na ndị nchekwa otu Iran's Islamic Revolutionary Guards Corp (IRGC) ji ogbunigwe wakpo USS Abraham Lincoln.

Ebe ndị ọzọ a tụrụ ogbunigwe gunyere: Dubai, Doha, Bahrain nakwa Kuwait.

Iran adọọla isi na ha ga emegwara mwakpo Izrel na Amerịka wakporo ha.

Etu ọ dị ugbua, a na-atụ anya na ndị ọchịchị n amba Iran ga-ahọpụta onye ndu ọhụrụ.

Ayatolla Khamenei: Ndị ngagharịiwe ataala isi mmadụ itoolu na Pakistan

Miniista na-ahụ maka mmekọrịta Pakistan na mba dị ozọ katọburu ihe ọ kpọrọ 'mwakpo enweghị ihe kpatara ya megide Iran

Ebe foto si, Reuters

Mmadụ itoolu nwụrụ, ebe o pekata mpe mmadụ 32 merụrụ dịka ndị na-eme ngagharịịwe na mba Pakistan wakporo ụlọ nnochite mba Amerịka nadị n'isiobodo ha bụ Karachi iji gosi iwe ha banyere mwakpo tara isi Ayatola Khamenei, onye ndu ndị Ụka Alakụba nke mba Iran.

Gọọmentị mba Uk enyela ozi ịdọ aka na ntị nye ụmụamaala ha nọ na mba Pakistan ka ha welata aka na ị gbagharị n'ihi ọgbaghara ahụ. Ndị na-akwado mba Iran malitere ngagahrịiwe na mpaghara dị iche iche ebe ndị alaka ụka Alakụba a kpọrọ Shia bụ ndị na-akwado ọchịchị Iran nọ.

Ọtụtụ n'ime ha zọrọ gaa Lahore ebe Ụlọnnochite Amerịka dị.

Mwakpo Amerịka na Izrel na-eme n'Iran mere Pakistan na-adọli ị hụ na o nw ha emekụtaghị mmekọrịta ha na Donald Trump nwere na nkwado ha nwere nye ịran.

Miniista na-ahụ maka mmekọrịta Pakistan na mba dị ozọ katọburu ihe ọ kpọrọ 'mwakpo enweghị ihe kpatara ya megide Iran'.

Ayatolla Khamenei: Ndị n'ọchị, ndị n'akwa dịka e gburu onye ndu mba Iran na mwakpo Amerịka na Izrel mere Iran

Ọtụtụ ndị ezinaụlọ e gburu ndị nke ha na ngagharịiwe na nsonso a nọkwa n''ụlọ ha enwe aṅụrị.

Ebe foto si, Getty Images

Ụfọdụ ndị Iran na-akwa arịrị, ebe ụfọdụ na-enwe anwụrị dịka akụkọ kwuru na e gbuola Onyeisiala Mba Iran bụ Ayatollah Ali Khamenei na mwakpo nke mba Amerịka na Izrel jikọrọ aka mee ụbọchị Satode.

Ihe onyonyo BBC Persia nyochara gosiri ndị mmadụ na-aṅụrị na-apị opi ụgbọala ha n'ọtụtụ obodo mepere emepe dị na mba Iran.

Ihe onyonyo ọzọ gosiri ebe ndị mmadụ gbakọrọ n'okirikiri ọkụ a mụnyere na-agba nọkawụtụ.

Ọtụtụ ndị ezinaụlọ e gburu ndị nke ha na ngagharịiwe na nsonso a nọkwa n''ụlọ ha enwe aṅụrị.

Onyendu kachasị n'Ịran bụ Ayatollah Ali Khamenei anwụọla na mwakpo Amerịka na Izrel wakporo Ịran

Iran atụgwarala ogbunigwe na mba Izrel

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọọrụ mgbasaozi n'Ịran ekwuola na onyendu kachasị n'Ịran bụ Ayatollah Ali Khamenei anwụọla na mwakpo mba Amerịka na Izrel wakporo Ịran n'ụbọchị Satọde 28 February, 2026.

Onyeisiala Donald Trump kọwara Khamenei dịka ajọ mmadụ ma kpọ oku ka ndị mba Ịram weghara mba ha.

Ka ọ dị ugbua a, ọtụtụ ndị mba Ịran jupụtara n'ụzọ na-ene aṅụrị maka ọnwụ Khamenei ebe otu onye gwara BBC na ọnwụ Khamenei pụtara na 'ụwa adịla mma'.

Ụlọọrụ Red Crescent kwuru na ihe ruru mmadụ 200 anwụọla n'Ịran ebe ihe ruru mmadụ 108 nwụrụ oge Amerịka na Izrel tụrụ ogbunigwe n'ụlọakwụkwọ ụmụnwaanyị.