Nigerian Army: Ndị Aba ebola ndịagha Naịjirịa ebubo mkpagbu

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ si Aba apụta na-akọwa na ndị agha Naịjirịa na-akpagbu ndị ntorobia bu isi dada n'obodo ahụ.
Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Punch siri kwuo, nke a mere n'ụbọchị satọde gara aga.
Ha kọwara na a nwụchiri ụmụokorobia bu dada, kpụọ ha isi ma pịa ha ụtarị n'Aba.
Dịka e mechara nke a, ndị agha ahụ kpụrụ ụmụntorobia ndị ahụ gaa ebe o nweghi onye ma.
Ndị mmadụ hụrụ ebe ihe mere kwuru na obi adịghị ha mma maka ihe ụmụnwoke ahụ gabigara n'aka ndị agha.
Mgbe BBC Igbi kpọtụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndịagha bụ Sagir Musa, o kwuru na ọnụbeghi maka akụkọ a mbụ.
O kwukwara ka akpọghachi ya mana ihe niile a nwara ịnweta ya n'ekwentị amịtaghị mkpụrụ
Mana otu onye ntaakụkọ nọ n'Aba achọghị ka akpọpụta aha ya gwara BBC Igbo n'ekwentị na ihe ahụ mere n'ezie.











