Akụkọ kachasị taa: Ndị agha Naịjirịa na Boko Haram, akụkọ sịrị Imo na Sierra Leone
Akụkọ kachasị taa
Ndị agha Naịjirịa agbagbuola ndị agha Boko Haram anọ

Ebe foto si, Getty Images
Ndị agha Naịjịria ekwuola na ha gbagburu ndị agha Boko Haram anọ n'obodo Malumti na-adighị anya ohịa Sambisa.
Ha kwakwura na ndị agha Naijiria nwakporo ndị agha Boko Haram oge ha na achọ nrị na mmịrị na obodo ahụ.
Ndị uweojii na-atụ ndị otu nzizo aka na ogbugbu nwata akwụkwọ a
Ndị uweojii na Imo steeti ekwuola na ọ bụ ndị otu nzizo bụ ndị gbagburu nwata akwụkwọ ahụ akpọrọ Kelechi Ibe na mahadum steeti ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Ibe bụ nwata akwụkwọ na-eme mmemme nlote ụbọchị amụrụ ya oge ndị a batara gbagbuo ya.
Ha kwuru na ugbua aka na achọ ndị a mere omume a.
Onye ga-emeri na ntụlịaka Sierra Leone?
Ala Sierra Leone na-eme ntụlịaka taa maka ị họpụtara onye ga-abụ onye isi ala ha ọhụrụ.

Cheta na a kwusịrị mbinyeaka a na mbido onwa a maka ebubo na ntu na aghọghọ abagọ na yabụ mbiyeaka.
Ọ bụ Julius Maada na Samura Kamara bụ ndị na-azọ okwa ọchịchị ugbua.
N'akụkọ egwuregwu

Anthony Joshua na Joseph Parker ga-asọ mpi n'egwuregwu ịkụ ọkpọ taa n'ime Principality stadium na Wales n'abali taa.
Joshua bụ nwaafọ Naịjiria bụkwa onye mba Britain bụ oka mgba na mba uwa na egwuregwu ịkụ ọkpọ.
Nkeji nke abalị a










