Victims of Torture Day: Ndị agha Naịjirịa na-eme ya mgbe niile - Amnesty International

NDị Uweojii

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị Uweojii

Ụlọọrụ Amnesty International na-ekwusi ike na ndị ọrụ nchekwa ka na-emekpa ndị mmadụ ahụ na Naịjirịa.

Ha kwuputere nkea dịka a na-eme emume ncheta ụbọchị e ji akwado ndị a na-emegbu emegbu dabara na ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa June.

N'agbanyeghi atụmatụ gọọmentị etiti weputara maka nkea, ndị Amnesty International kwuru na ha ka na-enweta mkpesa maka mmegbu ndị mmadụ n'aka ndị uweojii na ndi Agha.

Ndị otu a gbarụrụ ihu maka na ndị gọọmentị etiti anaghị ejide ndị nchekwa daara iwu a.

"Na agbanyeghị na Naijirịa agbaala mbọ maka mmegbu n'aka ndị nchekwa, site na iwu dịka 'Anti-Torture Act for December 2017' na ngalaba onyeisiala hibere maka ịmegharị ma chigharịa otu ndị uweojii

pụrụ iche maka igbochi ohi (SARS), ndị uweojii na ndị nchekwa ndị ọzọ ka jikwa mmekpahụ na mmegide anya isi. "

"Nyocha anyi na egosi na kemgbe ehibere ngalaba a maka mmekpeahu na mmegide, e nwebehi onye Uwe ojii ma ọ bụ ọnye nchekwa e jidrer" Ojigho kwuru.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: