Ndị uwe ojii ahapụla onye kpokobara otu #BringBackOurGirls

Oby Ezekwesili

Ebe foto si, Ezekwesili Facebook

Nkọwa foto, Ezekwesili bidoro otu #BBOG iji gbapụta ụmụaka Chibok
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị uwe ojii n'Abuja ahapụla onye kpokobara otu #BringBackOurGirls bụ Oby Ezekwesili, onye ha jidere ya na ndị otu ya na Unity Fountain dị n"Abuja.

Dịka Ezekwesili siri dee n'akara twitter ya, o kwuru na ndị uwe ojii agwaghị ha ihe ha mere ha jiri kpụrụ ha.

O kwuru na ha gwara ndị uwe ojii ahụ ka ha gwa ha ihe ha mere megidere iwu mana onye isi ndị uwe ojii n'Abuja bụ CP Bello sịrị ha gawa.

Ezekwesili kwukwara na kọmishọna ahụ kwuru ka a hapụ ya na ndị otu ya ka ha laa.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ezekwesili tiri mkpu oge a nwụchiri ya ndị otu ya na Unity Fountain na-ekweghi ka ha hapụ ebe ahụ.

O depụtara n'akara ya na twitter na ndị uwe ojii ahụ jidere ya na ndị otu ya dịka ha na-eme njegharị iwe gbasara ụmụaka ụmụnwaanyị Chibok ndị Boko Haram tọrọ n'afọ 2013.

Ezekwesili ji otu #BringBackOurGirls na-amanye gọọmenti ka ha gbapụta ụmụaka Chibok ndị a na-agbapụtabeghi.

Otu ahụ mekwara mba ụwa niile jiri kwado ala Naịjirịa oge ndị Boko Haram tọrọ ụmụaka ahụ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Skip X post, 3

End of X post, 3

Otu onye ndu n'otu ahụ, gwara BBC na ọ tụrụ ha n'anya ihe ha mere megidere iwu e jiri kpụrụ ha.

Ha kwuru na ihe ndị uwe ojii mere megidere ọchịchị onye kwuo uche ya.

O dobeghi anya mmadụ ole ndị uwe ojii nwuchiri na ihe kpatara ha ji kpụrụ ha.

Ndị #BBOG

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Oby na ụmụnwaanyị ndị atọrọ ụmụ ha Chibok

Ezekwesili buburu mịnịsịta na-ahụ maka agụmakwụkwọ.

Mbọ niile BBC Igbo gbara iji nweta ndị uwe ojii amịtaghị mkpụrụ dịka ndị uwe ojii anaghị aza oku.

N'aka nke ọzọ, Ezekwesili bidoro otu ọzọ ọhụrụ nke ọ kpọrọ otu Red Card.

O kwuru na otu a bụ iji mee ka Naịjirịa nwe ezigbo ọchịchị na ịchụpụ ndị anaghị achị nke ọma.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4