Amnesty Int'l ekpeela Shell na Eni ọzọ

Ebe mmanụ agbidi wụfuru

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị Niger Delta na-ebe akwa na mmanụ agbidi emebichala ala ha

Otu akpọrọ Amnesty International agwuala gọọmentị Naịjịrịa ka ha laghachị azụ na-nyocha ihe mere mmanụ agbidi wụufuru na mmirị Naija Delta.

Ha kwuru na Shell na Eni wụfuru mmanụ ugboro iri na asatọ n'ime Niger Delta.

Ha kwukwara na Shell na Eni na-asị asị gbasara ugboro ole ha wụfuru mmanụ na mmiri Niger Delta.

Aziza Shell na Eni

Shell na Eni ekwuola na ebubo a abụghị eziokwu. Ha kwuru na oge niile mmanụ ugboro wụfuru, ha na-agba mbọ hicha ya.

Mana Amnesty International na-ekwu na ha anaghị ehicha mmanụ a n'oge. Ha mara atụ na otu oge Shell na Eni ji ụbọchị narị anọ na iri atọ were hicha mmanụ wụfuru.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ

.