Onyeisiala Tinubu ewepụtala aha ndị ọzọ maka ọrụ nnọchiteanya Naịjirịa na mba ofesi

Foto Onyeisiala Tinubu na Ibok-Ete

Ebe foto si, Bayo Onanuga

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Onyeisiala Bola Tinubu ezigarala Ụlọomeiwu Sịnetị Naịjirịa aha mmadụ iri atọ na atọ ọzọ ga-arụ ọrụ dịka ndị nnọchịteanya Naịjirịa na mba ofesi.

Akwụkwọ ozi ahụ bụ nke Onyeisi Ụlọomeiwu Sịnetị bụ Sịnetọ Godswill Akpabio gụpụtara oge ha nwere ọgbakọ n'ụbọchị Tọzde 4 Disemba, 2025.

Aha ndị ọhụrụ Onyesiala Tinubu họpụtara gụnyere Vice Admirral Ibok-Ete, Ita Enang, Chioma Ohakim, Abdulrahman Dambazau na ọtụtụ ndị ọzọ.

Ka ọ dị ugbua, aha onyeisiala wetaara Ụlọomeiwu Sịnetị dị aha mmadụ iri isii na ise.

Onyeisiala Bola Tinubu rịọrọ Ụlọomeiwu Sịnetị ka ha nyochaa ma kwado aha ndị ahụ iji hụ na ha malitere ọrụ nnọchiteanya, ma kwalite mmekọ Naịjirịa na mba ofesi dị iche iche.

Omokri, Fani-Kayode, Ikpeazu na ndị ọzọ Onyeisiala Tinubu wepụtara aha ha maka ọrụ nnọchịtaanya Naịjirịa

Onye bụbu onye ndụmọdụ onyeisiala Naịjirịa bụ Reno Omokri, Gọvanọ chiburu Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu na Femi Fani-Kayode bụbu mịnịsta na-ahụ maka ọdọ ụgbọelu

Ebe foto si, Bayo Onanuga

Nkọwa foto, Reno Omokri, Okezie Ikpeazu na Femi Fani-Kayode

Bola Tinubu bụ Onyeisiala Naịjirịa ewepụtara aha mmadụ iri atọ na abụọ ga-arụ ọrụ dịka ndị nnọchịtaanya mba Naịjirịa na mba Ofesi.

Dịka etu akwụkwọ ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Bayo Onanuga wepụtara, e zigara aha ndị ahụ n'ụlọ omeiwu Sịneti Naịjirịa maka ime ha nnyocha.

N'ime ndị ahụ bụ mmadụ iri na ise bụ ndị a maama ntọnaala ha bụ ọrụ nnọchịtaanya nke bekee kpọrọ "career ambassadors" ebe mmadụ iri na asaa ndị ọzọ bụ ndị si na ngalaba ọrụ dị icheiche nke bekee kọwara dịka "non-career ambassadors".

N'ime ndị ahụ bụ ụmụnwaanyị iri.

Aha ndị ntọnaala ha abụghị ọrụ nnọchịaanya

Femi Fani-Kayode bụbu mịnịsta na-ahụ maka ọdọ ụgbọelu na ndị ọzọ aha ha pụta na ndị ga-anọchịtaanya Naịjirịa na mba ofesi.

Ebe foto si, Bayo Onanuga / x

N'ime ndị a họpụtara ntọnaala ha abụghị ọrụ nnọchịtaanya gunyere:

  • Ọkaiwu Ogbonnaya Kalu si Abia steet,
  • Onye bụbu onye ndụmọdụ Onyeisiala Naịjirịa bụ Reno Omokri si Delta steeti,
  • Onye bụbu onyeisi ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) bụ Mahmud Yakubu,
  • Nwunye gọvanọ chiburu Ekiti steeti bụ Erelu Angela Adebayo,
  • Gọvanọ chiburu Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi.
  • Tasiu Musa Maigari bụbu onyeisi ụlọọrụ Omeiwu na Katsina steeti
  • Yakubu N. Gambo bụbu kọmịssịona,
  • Femi Fani-Kayode bụbu mịnịsta na-ahụ maka ọdọ ụgbọelu si Osun State
  • Otunba Femi Pedro
  • Ọkaiwu Nkechi Linda Ufochukwu
  • Fatima Florence Ajimobi,
  • Lola Akande,
  • Grace Bent,
  • Victor Okezie Ikpeazu bụbu gọvabọ Abịa steeti,
  • Jimoh Ibrahim,
  • Paul Oga Adikwu .
  • Ọkachamara Nora Ladi Daduut.

Lee ndị ntọnaala ha bụ ọrụ nnọchịtaanya

N'ime ndị ọrụ ha nakwa ntọnaala ha bụ ọrụ nnọchịtaanya. Ndị a bụ ndị ga-arụ ọrụ dịka nke bekee kpọrọ 'ambassador' maọbụ 'high commissioner' gunyere ndị a:

  • Enebechi Monica Okwuchukwu (Abia),
  • Yakubu Nyaku Danladi(Taraba),
  • Miamuna Ibrahim Besto(Adamawa),
  • Musa Musa Abubakar (Kebbi),
  • Syndoph Paebi Endoni (Bayelsa),
  • Chima Geoffrey Lioma David(Ebonyi)
  • Mopelola Adeola-Ibrahim(Ogun)
  • Abimbola Samuel Reuben (Ondo)
  • Yvonne Ehinosen Odumah (Edo)
  • Hamza Mohammed Salau(Niger)
  • Shehu Barde(Katsina)
  • Ahmed Mohammed Monguno(Borno)
  • Muhammad Saidu Dahiru(Kaduna)
  • Olatunji Ahmed Sulu Gambari(Kawara)
  • Wahab Adekola Akande (Osun).
Onye bụbu onye ndụmọdụ onyeisiala Naịjirịa bụ Reno Omokri, Gọvanọ chiburu Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi na Gọvanọ chiburu Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu

Ebe foto si, Bayo Onanuga / X

Nkọwa foto, Reno Omokri, Ifeanyi Ugwuanyi, na Okezie Ikpeazu

Kedụ obodo a ga-eziga ndị a?

Obodo a ga-eziga ndị a bụ ọtụtụ mba Naịjirịa na ha nwere ezi mmekọ.

Ha ga-abụrụ ndị nnọchịaanya Naịjirịa na mba ndị ahụ nke gunyere Chaịna, India, Sọụt Korịa, kanada, Mexiko, United Arab Emirates, Katar, Saụt Afrịka, na Kenya Dgz.

Ọtụtụ n'ime ha ga-anọchịtaanya Naịjirịa n'otu jịkọtara mbaụwa dịka United Nations, UNESCO, nakwa otu jịkọrọ mba Afrịka bụ African Union (AU).

Cheta na ụlọomeiwu Sịnet Naịjirịa ka ga-eme ndị a niile nnyocha nabata ha ịnọchịtaanya Naịjirịa tupu Onyeisiala Bola Tinubu eziga ha ọrụ ịnọchịtaanya Naịjrịa.

N'izuụka garaaga ka Onyeisiala Bola Tinubu wepụtara aha mmadụ atọ ga-anọchịtaanya Naịjirịa na mba UK, USA na Fransị nke gunyere Ayodele Oke (Oyo steeti), Amin Mohammed Dalhatu (Jigawa), na kọnelụ Lateef Kayode Are (Ogun).

Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu kwuru na aha ndị ọzọ ga-nọchịtaanya Naịjirịa ga-apụta mgbe na-adịghị anya.