Ụka Katọlik Dayọsis Kontagora ewepụtala aha ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi a tọọrọ na Niger Steeti

Ebe foto si, Catholic Diocese of Kontagora
Ụlọụka Katọlik nke Dayọsis Kontagora ewepụtala aha ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi ka nọ n'aka ndị ekperima tọọrọ ha n'ụlọakwụkwọ St. Mary's nke Katọlik nwee dị na Papiri nke Niger Steeti.
Ụlọụka a kwuru na aha ọhụrụ a bụ nke e dekọtara n'ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Nọvemba afọ 2025 gosiri na ọnụọgụgụ ndị a tọọrọ bụ narị abụọ na iri isii na ise (265) bụkwanụ ndị ka nọ n'aka ndị ntọrị ahụ.
Nke a gụnyere ndị nkuzi ise, ndị ọrụ asaa na-abụghị ndị nkuzi, ụmụakwụkwọ sekọndịrị iri na anọ na ụmụakwụkwọ praịmarị na ọtakara narị abụọ iri atọ na itoolu.
A tọọrọ ndị a n'ụbọchị Fraịde iri abụọ na otu nke ọnwa Nọvemba afọ 2025, mgbe ndị ekperima wakporo ụlọakwụkwọ ha.
N'ụbọchị ụka, otu jikọtara ụka Kraịst na Naịjirịa bụ CAN n'ịchafụ kwuru na ụmụaka iri ise so na ndị a tọọrọ gbara ọsọ ma lọghachite n'aka ezinaụlọ ha.

Ebe foto si, Catholic Diocese of Kontagora

Ebe foto si, Catholic Diocese of Kontagora

Ebe foto si, Catholic Diocese of Kontagora
Ihe kọmịshọna ndị uweoji na Niger steeti gawara BBC
Ndị uweojii Naịja steeti ekwuola na ha ezigaala ndị uweojii na Papiri bụ obodo ebe a tọọrọ ọtụtụ ụmụakwụkwọ n'ụlọakwụkwọ St. Marys Catholic School.
Kọmịshọna ndị uweojii Naịja steeti bụ Adamu Abdullahi Elleman kpughere nke a oge onye ntaakụkọ BBC na-agba ya ajụjụ.
Adamu sịrị na "kemgbe ụbọchị mbụ ọdachi a mere ka anyị zigara ndị uweojii zuruoke na otu ndị ọzọ pụrụiche ebe ahụ."
Ọ gara n'ihu kwuo na ha ji isi ulọọrụ ndị uweojii dị n'Agwarra mere ebe ha si arụ ọrụ, nke pụtara na ha na-esite n'ụlọọrụ ha dị n'Agwarra na-aga ichekwa ụlọakwụkwọ ahụ.
Ka o sina dị, Adamu kwuru na ya nwetara ozi na ụmụakwụkwọ iri ise alọghachila, kama ọ sịrị na ụlọakwụkwọ ahụ ejighị ọnụ ha gwa ndị uweojii nke a.
Etu nwa m nwoke dị afọ isii si gbanahụ ndị ntọ n'ụlọakwụkwọ dị na Naịja steeti – Nna nwataakwụkwọ

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Otu nna nwataakwụkwọ gbanahụrụ ndị omekome tọọrọ ọtụtụ ụmụakwụkwọ n'ụlọakwụkwọ St. Marys Katọlik dị na Niger Steeti akọwaala etu nwa ya nwoke siri gbanarị ndị ntọ ahụ were zute ezinaụlọ ya.
Mgbe ụlọmgbasaozi BBC gbara ya ajụjụ ọnụ, nwoke ahụ a kpọrọ Lucas, bụ onye anyị gbanwere aha ya iji chekwaa njirimara ya kwuru, kwuru na "Mgbe m hụrụ ya, obi tọrọ m ezigbo ụtọ."
"A kpọrọ m ya aha, ọ tụgharịrị wee gbakwute m. M makụọ ya."
Lucas kwuru na nwa ya nwoke gwara ya na ụmụaka nọ n'ụlọakwụkwọ ndị Katọlik nke St Mary dị na steeti Niger nke dị na mpaghara Ugwu Naịjirịa na-ehi ụra mgbe ụda ndị tọọrọ kpọtere ha.
Ndị tọọrọ mmadụ gbawara windo ha, ma jiri egbe manye ha imepe ụzọ ahụ mgbe ha nọ n'ọkara ụra.
O kwuru na ụfọdụ ụmụaka rịgoro n'elu mgbidi waya gbara ụlọakwụkwọ ahụ gburugburu wee gbaa ọsọ, mana nwa ya nwoke dị obere nke na ọ gaghị agafe mgbochi ahụ nke mere o jiri wee zoo onwe ya.
Ka ọ dị ugbua, Lucas na otu nwa nwoke ezukọrịtala ọzọ mana ụmụnwoke ya abụọ nke okenye ka na-efu efu.
Cheta na a tọọrọ ụmụakwụkwọ narị atọ na atọ na ndị nkuzi iri na abụọ n'ụlọakwụkwọ dị n'obodo Papiri, mana ndị ọchịchị kwuru na opekatampe ụmụaka iri ise gbapụrụ n'aka ndị ntọ ahụ.
Dịka anyị si hụta, ụmụakwụkwọ iri ise ahụ e kwuru na ha gbanahụrụ ndị ntọ esighị n'ogige ndị tọọrọ mmadụ ahụ pụta kpọmkwem, n'ihi na nke a bụ ọnụọgụ ụmụaka gbapụrụ oge ndị omekome ahụ na-atọrọ ụmụakwụkwọ ndị ọzọ.
Onye ntaakụkọ BBC bụ Madina Maishanu kwuru na ọ dịghị onye n'ime ndị nne na nna ọ gwara okwu nke kwetere na ha na ụmụ ha ezutela n'ime awa iri abụọ na anọ gara aga.
Ọkwa a emeela ka ọtụtụ ndị nne na nna nwee mgbagwoju anya. Ụfọdụ nọ n'ogige ụlọakwụkwọ ahụ ebe a kpọrọ ụmụ ha, obi gbawara ha ma nwee mwute maka ihe mere na a gwaghị ha ozi ahụ ozugbo.
"Gịnị mere anyị ji ahụ akụkọ a na soshal midịa ma gọọmenti anaghị akpọtụrụ anyị ozugbo, anyị ezutebeghị ụmụ anyị."
Gịnị ka Gọvanọ na-achị steeti ahụ kwuru?
Na nzaghachi, gọvanọ steeti Niger bụ Umar Bago kwuru mgbe ya na ndị ntaakụkọ obodo nwere mkparịtaụka na a mụbara ọnụọgụgụ ụmụakwụkwọ a tọọrọ amụba. "Ọ bụrụ na anyị agụọ mmadụ n'isi nisi, ọnụgụgụ ahụ dịala karịa nke ahụ."
Gọvanọ ahụ boro ndị isi ụlọakwụkwọ ahụ ebubo maka imepe ụlọakwụkwọ ahụ mgbe ndị ojiegbe a na-amaghị aha ha yiri ha egwu afọ anọ gara aga na nke ọzọ ọnwa abụọ gara aga.
"Ụlọakwụkwọ ndị dị n'ogbe ahụ mechiri kemgbe afọ anọ ugbua, o juru m anya mgbe m nụrụ n'ụlọakwụkwọ ahụ mepere emepe."
O kwuru na mwakpo ahụ bụ naanị 'ihe egwu' nakwa na a ga-azọpụta ụmụakwụkwọ ndị ọzọ niile n'oge na-adịghị anya.
Ụfọdụ ndị nne na nna gwara BBC okwu enweghị afọ ojuju n'omume na nzaghachi ndị ọchịchị banyere ọnọdụ ahụ.
Naịjirịa na-agharịpụ ụmụaka n'ụzọ na-atụ egwu – Amnesty International

Ebe foto si, Amnesty International, Abdullahi Kabir
Otu na-ahụ maka ikike nke mmadụ na mbaụwa bụ Amnesty International ekwuola okwu gbasara mwakpo ndị na-aga n'ihu na Naịjirịa.
N'ozi ha wepụtara n'ụbọchị Satọde 22 Nọvemba 2025, Amnesty kọwara mwakpo ndị ahụ, ọkachasị ntọrị ụmụakwụkwọ na mpaghara ugwu Naịjirịa dịka nke na-egosi na gọọmenti anaghị agba mbọ dịka o si kwesị iji chekwaa ndụ ndị na-eto eto.
Nke a na-abịa dịka otu jikọtara ndị na-eso ụzọ Kraịst na Naịjirịa bụ Christian Association of Nigeria (CAN) kwupụtara na a tọọrọ ụmụakwụkwọ na ndị ọrụ narị atọ na iri na ise (315) n'ụlọakwụkwọ St. Mary's Catholic Primary and Secondary Schools dị na Papiri n'okpuru ọchịchị Agwarra nke Naịja steeti.
"Ndị ọchịchị Naịjirịa na-agharịpụ ụmụaka, dịka ihe karịrị ụmụaka narị abụọ na iri atọ (230) na mpaghara ugwu nọ n'agbụ ndị ojiegbe oge a tọọrọ ha na nnukwu mwakpo abụọ e mere n'ụlọakwụkwọ".
"Ọnọdụ ahụ ebutekwala mkpọbiụkwụ n'agụmaakwụkwọ imirikiti ụmụaka n'ihi mmechi e mechiri ọtụtụ ụlọakwụkwọ na Katsina, Plateau nakwa steeti ndị ọzọ," ka Amnesty kwuru n'ozi ahụ.
Ha gara n'ihu kwuo na "mwakpo e mere na nso nso a n'ụlọakwụkwọ dị na Kebbi nakwa Naịja steeti emeela ka o doo anya na ndị ọchịchị Naịjirịa enweghị oge ọbụla ha chọrọ ịmụrụ akọ site n'ọdachi ndị mere mgbe gara aga, bụ mgbe ndị ojiegbe tọọrọ ụfọdụ ụmụakwụkwọ."
Ọnụọgụgụ ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi a tọọrọ n'ụlọakwụkwọ St. Marys Katọlik, Niger Steeti eruola 315 - CAN

Ebe foto si, Africa Independent Television via Reuters
Ọnụọgụgụ ndị ojiegbe tọọrọ n'ụlọakwụkwọ St. Marys nke ụka Katọlik nwee, dị n'okpuruọchịchị Agwara Niger steeti eruola mmadụ narị atọ na iri na ise (303) dịka otu jikọtara ndị ụka Kraịst na Naịjirịa bụ CAN si kwuo.
Onyeisi CAN na Niger Steeti bụ Rev. Bulus Dauwa Yohanna bụ Bishọp ụka Katọlik na Dayọsis Kontagora kwuru nke a dịka ha mechara nnyocha ọnụọgụgụ n'ebe ahụ.
Ozi ọhụrụ ha wepụtara gosiri na a tọọrọ ụmụakwụkwọ narị atọ na abụọ ebe ndị nkuzi na ndị ọrụ ọzọ ruru mmadụ iri na abụọ.
Otu ndị okpukperechi kraịst na Naịjirịa 'Christian Association of Nigeria' kwuru n'ụmụakwụkwọ narị abụọ, iri na ise na ndị ọrụ iri na abụọ bụ ndị akpọrọla mgbe e mere mwakpo ahụ.

Ebe foto si, Abdullahi Kabir/BBC
Akụkọ kwuru na ndị ojiegbe ahụ wakporo ụlọakwụkwọ n'isi ụtụtụ Fraịde ma tọọrọ ọtụtụ ụmụakwụkwọ, ndị nkuzi na ndị ọrụ.
Ndị a ji ọtụtụ ọgbatumtum na nnukwu ụgbọala ma gbaa otu onye na-eche ụlọakwụkwọ ahụ nche egbe.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Steeti ahụ bụ SP Abiodun kwuru na ihe a mere n'ihe dịka elekere abụọ nke ụtụtụ mgbe ụmụakwụkwọ ahụ na-ehi ụra.
Ndị uweojii sị ha ezigaala ndị ọrụ nchekwa ha gụnyere ndịagha n'ebe ahụ ma nye ha iwu ka ha banye n'ime ọhịa iji chọta ndị ahụ.

N'akwụkwọ ozi ọzọ, gọọmentị steeti ahụ sị na ha nyere iwu ka a kwụsị ọrụ n'ebe ahụ ma sị ka e mechie ụlọakwụkwọ ebe ụmụakwụkwọ bi n'ime ha, mana ndị nwe ụlọakwụkwọ ahụ gara n'ihu mepee ụlọakwụkwọ ahụ na-agwaghị gọọmentị.
Gọọmentị sị na ha nwetere ozi banyere iyi ndụ egwu ahụ n'izuụka ole ma ole gara aga na mpaghara Niger dị iche iche.
Ụlọakwụkwọ St. Marys bụ ụlọakwụkwọ mmadụ new nke ụmụakwụkwọ bi n'ime ya, ọ gụnyere ma praịmarị na sekọndịrị.
Ọ bụ ụlọakwụkwọ ụmụnwoke na nke ụmụnwaanyị.
Mwakpo a na-abịa n'ime ụbọchị ole ma ole ndị ntọ wakporo ma tọọrọ ụmụakwụkwọ n'ụlọakwụkwọ dị na Kebbi steeti ma wakpokwa ụlọụka dị na Kwara Steeti ebe ndị mmadụ na-efe ofufu.
"A tọọrọ ụmụ nwanne m nwaanyị abụọ"

Onye nwoke aha ya bụ Sunday bụ nwafọ Igbo bi na Niger Steeti sị gwara BBC na ụmụaka abụọ si n'ezinaụlọ ha so na ndị a tọọrọ.
Ọ sị na ọ bụ ụmụ nwanne ya nwaanyị abụọ so n'ọtụtụ ụmụaka ndị a tọọrọ.
Sunday kwuru na nwanne ya nwaanyị bụ Lotachukwu Agnes Okoye nwere ụmụaka anọ na-aga n'ụlọakwụkwọ ahụ mana na omekome ahụ tọọrọ mmadụ abụọ n'ime ha.
Ọ sị na ụmụaka abụọ ahụ dị afọ isii na iri na atọ ma nọọrọ n'ogogo ụlọakwụkwọ ọtakara (Nursery ) nke atọ na praịmarị isii.
N'okwu ya "O nwere ndị gwara anyị na ụgbọala bụ ụmụaka ndị ahụ mebiri n'ụzọ mana anyị gwara ndị nchekwa ka ha pụọ n'isi ụtụtụ gaa chụwa ha mana ha emeghị ya.
"Ndị si n'ime ọhịa na-apụta kwuru na ha hụrụ ụmụaka ndị ahụ ka ha ji ụkwụ n'aba n'ime ọhịa mana ndị nchekwa abịaghị n'oge chụrụ ha gawa."
Kedụ ihe gọọmenti kwuru
Tupu mwakpo nke ugbua, Onyeisiala Bola Tinubu adịla mbụ kagbuo nke o kwesịrị ime na mba Saụt Afrịka na Angola n'izuụka a n'ihi ọnọdụ nchekwa Naịjirịa.
O zigakwara osote ya bụ Kashim Shettima ka ọ gaa njem mgbaru na Kebbi Steeti iji hụụ ka ọnọdụ nchekwa si dị n'ebe ahụ.
Onye ndụmọdụ Onyeisiala bụ Daniel Bwala gwara BBC na onyeisiala ezigala ndị ọrụ nchekwa n'ọtụtụ ebe ndị ekperima na-akpa ike na Naịjirịa.
O kwukwara na onyeisiala ebuliela ego ọ mawapụtara maka nchekwa iji nye aka gboo nsogbu iyi ndụ egwu.
Mwakpo ndị ọzọ merela n'izuụka a

Ebe foto si, Getty Images
N'ime otu izuụka gara aga, e nweela ọtụtụ ọnọdụ nchekwa ọjọọ na Naịjirịa site na Kebbi Steeti gaa Kwara na Naịja Steeti ugbua.
Ndị ekperima a na-eche bụ ndị otu ISWAP gburu otu onyeagha ọkwa ya gbagotere bụ ọchịagha Sani Uba n'ebe a na-amaghị ebe ọ bụ. Otu ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia gosiri mgbe ha gbara ya egbe, ọ daa n'ala.
Na Kebbi Steeti, ndị ojiegbe gara n'otu ụlọakwụkwọ Gọọmentị nwee a kpọrọ 'Government Girls Comprehensive Secondary School' tọrọ ụmụakwụkwọ iri abụọ na ise.
A bịa na Kwara Steeti, ndị ojiegbe bara n'ime ụlọụka ebe ndị ụka na-efe ofufe, gbuo ụfọdụ mmadụ ma tọrọ ọtụtụ ndị ọzọ. Ihe a mere na Kwara Steeti mere ka gọọmenti mechie ụlọakwụkwọ dị na mpaghara ahụ.











