Ihe ndị m na-ese eruola mba ofesi ebe m seerela ndị dịka Rick Ross, Rihanna na ndị ọzọ ihe - Chiamaka Glamour Artz
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Nwada Chiamaka Iwenofu Richards bụ onye na-ese ihe a na-ahụ anya ma na-emetụ aka a kpọrọ 'visual artist' na Bekee kọọrọ BBC Igbo na ọ bụ mmasị o nwere n'ise mere o jiri ya mere aka ọrụ.
O kwuru na njem ya malitere na mgbe ọ ka bụ nwata, o kwuru na o so n'ụmụaka na-esekaarị ihe n'ụlọakwụkwọ mgbe ọbụla.
"A malitere m ise ihe mgbe m bụ nwata, eso m n'ụmụaka na-eme a na-akụzi ihe n'ụlọakwụkwọ ha were mkpịsị dị iche iche na-esekasị ihe.
"Dịka oge na-aga, achọpụtara m na ise ihe na-amasị ime, na oge ọbụla m nọ m na-ese ihe.
"M wee kpebie na m gụchaa ụlọakwụkwọ sekọndịrị na m ga-abanye mahadum ga-agụọ maka ngalaba ise ihe (art and applied science). Etu ahụ ka m si bidozie na-ese ihe."

Chiamaka kwuru na ọ malitere itinye ihe ndị ọ na-ese ọtụtụ ihe e nwereike ịhụ anya ma metụ aka dịka akwa, ịkpa isi, nkụ na ihe ndị ọzọ ka ọrụ ya nwee ike gbapụ iche na nke ndị ọzọ.
"Ana m ese ihe m ọ na-aga ọfụma mana o ruru otu ụbọchị m chọọ ihe m ga-eme ka ọrụ m pụọ iche n'ihe ndị ọzọ na-eme, m kpebiri ka m tinye ya ịkpa isi, ịkwa akwa, mgbe m tinyere ya na soshal midia ndị mmadụ hụrụ ya n'anya na-ekwu na ọ pụrụiche."
O kwuru na ihe niile ọ na-ese bụ iji kọọ otu akụkọ maọbụ nke ọzọ, na ụfọdụ ha bụ ndị ọ rọrọ na nrọ ebe ndị ọzọ bụ o chepụtara n'uche site n'ihe ndị na-eme na gburu gburu ya.

Chiamaka kwuru na ihe ndị ọ na-ese agbazuola mba Afrịka nakwa mba ofesi dịka o seerela ọtụtụ ndị a ma ama na Naịjirịa nakwa mba ofesi ihe, nke gụnyere Don Jazzy, Kcee, Rick Ross, Rihanna na ndị ọzọ.
"Arụọrọla m Don Jazzy, rụọrọ Kcee ọrụ, rụọrọ Flavour, ndị m rụrụ ọrụ akarịala. O nwekwara ndị ọcha m rụrụ ọrụ, arụọrọla m RickRoss, rụọrọ Rihana bụ nke di ya nyere m ka see ya, arụọrọla m Swae Lee."
Ọ gara n'ihu kwuo ọtụtụ uru ọrụ ise ihe baara ya nke dịka ihiwe ụlọ ebe a na-ese ihe ma na-ekiri ihe ndị o sere, ụlọ ebe a na-ese ihe ma na-aṅụkwa mmanya.
"Site n'aka ọrụ m bụ ihe m ne-ese, ejirila m ya nwete ebe a na-ese ihe ma na-ekiri ọtụtụ ihe ndị m sere na Legọs ebe a, enwere m ebe a na-ese ihe ma na-ekiri ihe onyonyo, n'ime nwekwara ebe a na-aṅụ mmanya na-esekwa ihe, ọ bụrụgodu ma ị maghị ka e si ese ihe, a ga-atụziri gị aka. Ọ bụ ihe a na-eme ebe a."


Chiamaka rụtụrụ aka n'ụfọdụ nsogbu ọ na-enwe n'ọrụ ise ihe ọkachasị n'aka ụfọdụ ụmụafọ Naịjirịa ndị na-asị na ise ihe bụ igbu oge na o nweghi uru ọ baara.
O kwuru na nke a mere na ihe ndị ọ na-esepụta na ọ bụ na mba ofesi ka ọ na-ere ha ma nwete ego.
"Ọ na-ewute m na ndị obodo anyị bụ Naịjirịa anaghị eto ọrụ m, ụfọdụ nwereike hụụ ya ma sị na ọ dị mma mana ọ bụghị mmadụ niile ga-ekwu okwu.Ụfọdụ na-ahụta ya na ọbụghị uru na mụ amaghị ihe m na-eme, na ọrụ ise ihe bụ igbu oge."
Kirie ihe o kwuru n'uju;


