Ihe kpalitere m ji see eserese obodo Amagu nke fesara n'ịntanetị niile - Juliet Godwin
- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi na Amaka Bassey
- Ndị mere akụkọ a, Journalist na Digital Technical Producer
N'ọdị nso a ka otu eserese fesara na soshal midia Naịjirịa dị icheiche; eserese a gosiri etu ime obodo dị icheiche dị na Naịjirịa n'oge ochie.
Ọtụtụ kesara eserese a n'akara soshal midia ha dịka ha kwuru na eserese ahụ chetaara ha maka obodo ha dị icheiche ebe ha nọrọ tolite.
Onye sere eserese ahụ, nwaada aha ya bụ Juliet Nwanyanwu Godwin, gwara BBC Igbo na mkparịtaụka na ọ bụghị naanị na soshal midia na Naịjirịa ka eserese ahụ fesara, o gbasara etu ahụ na mba Ghana, Senegal, Kenya na ndị ọzọ.
"Ọtụtụ ndị mmadụ si mba ndị a na-akpọ m n'ekwentị na-ajụ m ma mụ abịala mba ha mbụ, maka na eserese ahụ chetakwaara ha maka obodo ha dị icheiche," Juliet kwuru.

Nwaada a onye a ma na soshal midia dịka Juuju Girl maọbụ JuicyG, kwuru na ihe kpalitere ya o ji malite ise eserese na-egosi etu ndị Naịjirịa na ndị Afrịka si ebi n'oge gboo bụ na ya chọrọ ka ndị agbụrụ na-abịa abịa nwee ihe ha ga-ahụ iji chetara ha etu ndị nnanna ha n'Afrịka si bie ndụ ha.
"Ọtụtụ oge, ị gaa n'ịntanetị chọọ eserese gboo nke ndị mba mpaghara Ọdịda Anyanwụ ụwa, ị ga-ahụ ọtụtụ eserese dị icheiche bụ sọ mma, nke gosiri etu ndị eze ha si kee ekike, etu okirikiri ha si dị na ihe ndị ọzọ, mana ị chọọ eserese nke mpaghara Afrịka, ị ga-ahụ ihe dịka nwaanyị kwọ nwa n'azụ, buru ite n'isi, maọbụ ụdị ihe ahụ. Ọ pụtara na ọ bụ naanị etu a ka ndị Afrịka si eke ekike n'oge gboo? Juliet jụrụ.
"Anyị nwere omenala mara mma, ndị eze anyị na-eke ekike dị ọgọ, okirikiri anyị na-adị ọcha juputakwa n'aṅụrị, mana ọ bụrụ na anyị eseghị ihe ndị a tinye ya n'ịntanetị, onweghị onye ga-ama maka ha."
Juliet kwuru na etu ndị mmadụ si mpaghara Afrịka dị icheiche si anabata eserese ya gosiri na Afrịka bụ otu, "anyị niile nwere otu ụdị ahụmihe, obodo anyị nakwa omenala anyị yitere onwe ha, nke pụtara na o kwesịghị ka anyị nwee nkewa n'etiti onwe anyị".
AI ọ ga-anapụ ndị na-ese ihe ọrụ ha?

Ebe foto si, Juicyg94
Nwada Juliet kwuru na ọ bụ eziokwu na tekịnụzụ AI apụtala ugbua ma dịka ọ ga-anapụ mmadụ niile ọrụ ha, mana nke a agaghị emetụta ya dịka onye na-akwa nka.
"Cheta na ihe AI na-eme bụ iṅomi ihe ndị mmadụ merela ma tinye n'ịntanetị, ọ gaghị aba gị n'ụbụrụ mara ihe ibu n'uche ma see ya," Juliet kwuru.
"Ihe m na-ese na-esi n'uche m apụta. AI agaghị amatanwu ihe dị n'uche m.
"Tekịnụzụ AI bụ ihe dị mma, mana ụjọ ọbụla anaghị atụ m ma ọ ga-anapụ m ọrụ, n'ihi na ohere ga-adịrịrị oge niile maka ihe si n'uche mmadụ pụta."
Onye bụ Juliet Godwin

Ebe foto si, Juicyg94
Juliet Chinazo Nwaanyanwy Godwin bụ onye obodo Amagu n'Enugwu steeti ma bụrụkwa onye ji igwe kọmputa ese ihe nke a na-akpọ 'digital illustrator' na bekee.
Ọ malitere ise ihe oge ọ dị obere ma nwetakwa ezi nkwado n'aka nna ya, mana dịka nna ya nwụrụ oge ọ ka na-eto eto, nne ya gbochiri ise ma gwa ya ka o tinye uchu n'ịgụ akwukwọ.
Mana n'afọ 2015, dịka ọ lanahụrụ ihe mberede nke okporoụzọ, Juliet malitekwara ise ihe ọzọ dịka nne ya nyeziri ya nkwado.
Ọ bụ na Youtube ka ọ mụtara etu e si eji kọmputa ese ihe.
Otu eserese ya kpalitere ejije Nollywood a kpọrọ 'House of Secrets'. Ọtụtụ eserese ya apụtakwala n'ọtụtụ akwụkwọ eserese ụmụaka na Naịjirịa.



