Christine Nnaji: Nwata nwaanyị nwere 'autism' na-eji nka enyere ụmụaka ibe ya aka
- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi na Amaka Bassey
- Ndị mere akụkọ a, Journalist na Video Editor
- Ebeg o si, Lagos
Christine Nnaji nwere ọnọdụ a na-akpọ 'Autism Spectrum Disorder' nke bụ ọnọdụ na-emetụta ọtụtụ mmadụ n'ụwa niile.
Ụfọdụ ndị nwere ụdị ọnọdụ na-enwe nhịahụ ime ihe dị icheiche nke pụtara na ha na-achọ enyemaka oge niile.
Oge ụfọdụkwa, ndị nwere ọnọdụ ASD na-enwe nhịahụ ịmụ ihe, ịkpagharị n'onwe ha, maọbụ ịghọta ihe onye ọzọ na-ekwu.
Ọ bụ ụdị ọnọdụ a ka nwaada Christine Nnaji nwere, bụ nke nne na nna ya chọpụtara oge ọ dị afọ anọ.
Nne ya bụ Nonye Nnaji kwuru na ya bụ ihe gbara ya gharịị n'ihi na n'ime ụmụ ya ndị ọzọ, ọ bụ naanị Christine nwere ya bụ ọnọdụ.
O kwuru na Christine na-etobu dịka nwata zuru oke oge ha ka nọ na mba Ireland ebe ọ nọrọ mụọ ya, "mana dịka anyị lọtara na Naịjirịa oge ọ na-abanye afọ nke anọ, ihe niile agbanwee, ọ dịzie ka a ga-asị na nwa m laghachiri azụ".
"Ọ naghịkwa ekwunwu okwu, ọ naghị amụnwu ihe, naanị anya ka ọ ga na-ele otu ebe ogologo oge," Nonye Nnaji kwuru.
Christine dịịrị etu ahụ ruo n'afọ 2021, mgbe nne ya chọpụtara na o nwere onyinye ise ihe, nke mere ka ndụ ya gbanwee.
N'afọ 2022, BBC Igbo kọrọ akụkọ etu ise ihe si gbanwee ndụ Christine, mana anyị laghachiri azụ ka anyị lee etu ndụ ya dị ugbua.
"Akụkọ Christine na BBC mepere ọtụtụ ụzọ nye ya, ma nyekwa ọtụtụ ndị nne bụ ndị nwere ụmụaka dịka ya mana ha amaghị ihe na-eme ha," Nonye Nnaji kọwara.
"Kamgbe ahụ, Christine agaala ọgbakọ ngosipụta eserese ya, ma rekwaa ọtụtụ n'ime ha. Anyi ji ego ndị ahụ hibe Christine Njoku Foundation maka ịchọta ma nyere ọtụtụ ụmụaka ndị ọzọ nwere ọnọdụ ASD aka," ka o kwuru.
"Ndị BBC, ụnụ emeela".

Gịnị bụ Autism Spectrum Disorder (ADS)

ADS bụ ọnọdụ dị icheiche nke ihe na-akpata ya bụ mgbanwe dị icheiche n'ụbụrụ mmadụ.
O nwerike imetụta etu mmadụ si ahụta ihe maọbụ anabata maọbụ azaghachi ozi dị icheiche.
ADS na-enwe ogogo nke mbụ, nke abụọ, na nke atọ; ndị nwere ADS ogogo nke atọ na-achọ nkwado pụrụ iche oge niile.
Ụbọchị nke abụọ n'ọnwa Eprel afọ ọbụla bụ ụbọchị nke otu 'United Nations' wepụtara dịka 'World Autism Awareness Day'.
A malitere emume a n'afọ 2007 iji na-agbasa ozi maka ọnọdụ 'autism' nakwa ịgbasa ozi maka ụzọ dị icheiche a ga-esi wulite ọnọdụ ndụ ndị nwere autism.














