Gọọmentị Abịa ekwuola na ọ bụ eziokwu na ụlọikpe machiburu ọbaego ha mana a tọhapụla ya ugbua

Okezie Ikpeazu

Ebe foto si, Abia state govt/Facebook

Gọọmentị Abịa steeti ekwuola na ọ ji ọṅụ agwaa ọha na iwu ha sị ụlọikpe ukwu nke Abuja nyere n’ụbọchị 28 nke ọnwa Maachị 2023 ka e jichie ego ndị nọ n’ọbaego ha n’ụlọakụ dị iche iche abụrụla ihe ụlọikpe ahụ kagburu.

Ozi a nke pụtara n’abalị Tọọzde, ụbọchị isii nke ọnwa Eprel na-apụta ka gọọmentị ahụ kwuburu mgbe akụkọ a gbara n’ọha na ya bụ akụkọ bụ akụkọ ụgha.

Ọnụ na-ekwuru goọmentị Abịa steeti bụ Eze Chikamnayo kọwara n’ozi ọhụrụ a o zipụtara kwuru:

“Oge e nyere ka iwu njichie dị ire agafeela.”

Dịka o gara n’ihu kwuo ihe o kwuburu ma ghara ịkpọ aha onye ọbụla n’ozi ya nke ohụrụ a.

O kwuru:

“Anyị na-ekeela Dkt. Okezie Victor Ikpeazụ maka mbọ ọ gbara ịgbapụta steeti anyị n’aka ndị obi ọjọọ chọrọ iji ụzọ ndọrọndọrọ ọchịchị chụ mkpa ha na-adịghị mkpa.”

N’izu gara, aga Chikamnayo kwubụrụ na aka Alex Otti zọọrọ Labour Party ọkwa gọvanọ steeti ahụ nọ n’ime ikesa akụkọ na e jichiri ọbaego steeti ahụ, nke o kwukwara oge ahụ na ọ bụ akụkọ ụgha.

Etu Alex Otti na gọvanọ Okezie Ikpeazu si dụọ onwe ha aka n'ọnụ maka okwu a

Alex Otti na Okezie Ikpeazu

Ebe foto si, Okezie Ikpeazu/Facebook/Alex Otti/Facebook

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Gọọmentị Abịa steeti kwuru mgbe akụkọ pụtara na ya bụ na e jichịrị ọbaego gọọmentị steeti ahụ n’ụlọakụ ndị nọ na Naịjirịa bụ akụkọ ụgha.

Ọnụ na-ekwuru gọọmentị steeti ahụ bụ Eze Chikamnayo n’ozi o zipụtara na Satọdee gara aga kwuru:

“Akụkọ a bụ atụmatụ ndị ọchọnganoko bịpụtara iji kụdaa gọọmentị abịa steeti ma kpata ọgbaghara.”

“Dịka anyị siri mara, enweghi akụkụ gọọmentị ọbụla nwere ikike site n’iwu megide akụkụ gọọmentị ọzọ.”

“Ihe a bụ ikpe nkonukọ nke adigboroja, nke ụdịrị ‘Okon Abang’, ihe megharie ọha anya.”

Ọ gara n’ihu boo ebubo na ọ bụ Alex Otii nke Labour Party, bụ onye a họpụtara ịchị Abịa steeti n’afọ anọ na-abịa abịa bụ onye zipụtara akụkọ a iji tetọọ aha gọọmentị steeti ahụ.

Cheta na akụkụ pụtara n’izu a ma malite ifesa na soshal midia nke kwuru na ụlọikpe ukwu nke Abuja nyere iwu ka e jichie ọbaego gọọmentị Abịa steeti niile nọ n’ụlọakụ 27 dị iche iche na Naịjriịa.

Akụkọ a fesara ekwughi ihe mere e ji okwu gọọmentị garuo ụlọịkpe maọbụ ihe bụ isi okwu mkpesa e mere n’ụlọikpe.

Ozi Chikamnayo gara n’ihu gwaa Otii na ndị otu ya ka ha ‘mara na oge gọọmentị nọ n’ọchịchị ugbua ga-ebi n’ụbọchị 29 nke ọnwa Mee 2023, unu agbalahụla chi unu n’ọsọ.’

O kwukwara na ‘ozi rurula gọọmentị anyị ntị bụ na akụkọ ụgha ndị dị etu a ka ga-apụtakwu na nso nso a.’

Ọnụ na-ekwuru Alex Otti bụ Ferdinand Ekeoma kwuru na ebubo ndị a achịtaghị aja dịka ọ kọwara na ya bụ ebubo bụ ụgha chara acha.

Ozi Ekeoma zipụtara nke BBC Igbo hụrụ n’ụbọchị Sọnde kwuru:

“Enweghi ihe jịkọrọ Otti na mbipụta akụkọ a na-efegharị”

“Ebe gọọmentị Abịa chọrọ itetọ aha nakwa ọchịchị Alex Otti, ka ọha marazie nke bụ nke.”

“Ka gọọmentị Abịa steeti pụta gwa ụwa ndị ya ha nwere nkwekọrịta n’ọrụ gwuru ha wayo”

“Ọ bụ tara akpụ ha ịpụta gbaa akwụkwọ ikpe a n’anwụ?”

“Ndị na-akpọ aha Alex Otti n’okwu marakwa na ọtụtụ ụgwọ e ji eji, ndị ọrụ akwụbeghị ụgwọ, ndị larala ezumike nka e ji ụgwọ nakwa ihe ndị ọzọ gọọmentị a hapụrụ ime bụ ihe ndị na-echere Otti aka mgba ugbua nke mere enweghi ohere ị na-egbu oge n’okwu akụkọ ụgha."

Akụkọ na-abịa dịka ọ fọrọ otu ọnwa ka Gọvanọ Okezie Ikpeazu nke pati Peoples Democratic Party (PDP) nyefe Alex Otti nke Labour Party ọchịchị ka ọ chịchara afọ asatọ na steeti ahụ.

N'abalị 22 nke ọnwa Maachị, bụ ka ọ gachara abalị anọ e ji mee ntuliaka ọkwa gọvanọ, ụlọrọụ na-ahazị ntuliaka Naijiria bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) kpọpụtara Otti dịka onye meriri na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Abia steeti ahụ nke 2023.

Dịka onye ọrụ Inec chịkọtara ntuliaka ahụ bụ Ọkammuta Nnenna Oti si kpọpụta ya, Otti ji vootu 175,467 were merie Okey Ahiwe nke Peoples Democratic Party (PDP) bụ onye nwetara vootu dị 88,529, ebe Enyinnaya Nwafor nke Young Peoples Party (YPP) gbara onye nke atọ nwetara vootu 28,972.