Etu m ga-esi weghachite ebube na ugwu Abia steeti – Alex Otti

Aha onyonyo, Etu m ga-esi weghachite ebube an ugwu Abia steeti – Alex Otti
Etu m ga-esi weghachite ebube na ugwu Abia steeti – Alex Otti
    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist
    • Ebeg o si, Umuahia, Abia state

Onye na-azọrọ otu Labour Party ọkwa gọvanọ na ntuliaka nke 2023 n’Abịa steeti bụ Alex Otii nọrọ na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na nso nso kwupụta atụmatụ na ebumnobi ya n’ibughachite ebube steeti ahụ etu ọ dịbụ n’oge gara aga.

Otii kọwara na Abia steeti sobụ na steeti Naịjirịa ji eme ọnụ n’oge gara aga dịka e ji ịzụ ahịa mara ha.

Dịka ntuliaka ọkwa gọvanọ na-abịa n'ụbọchị 18 nke ọnwa Maachị 2023, Otii gwara BBC Igbo etu o sirila gbaa mbọ igosi ọha ihe mere o jiri bụrụ onye ha kwesịrị ịtụnyere vootu.

O kwupụtara etu ihe ọ chee bụ ajọ ọchịchị siri mee steeti abụ bụbu steeti mepere emepee adịzịe ka ebe na-emepeghị.

Alex Otii

Ebe foto si, Alex Otti/Facebook

O jikwa ohere ahụ kpọpụta nnukwuu ụlọọrụ olemole gụnyere nke ndị mba ofesi buruula ngwo ngwo na ngwa ọrụ ha kwapụ na steeti ahụ n’ihi etu ọnọdụ ya bụ steeti siri dị ugbua.

O kwuru na dịka ọ bụ onye ọkaibe n’ihe gbasara mmụba akụnụba nakwa okwu ego na ọ ga-eji aka ahụ rụọrọ steeti ahụ ọrụ ma hụ na e weghachitere ebube na ugwu ya.

Kirie ihe onyonyo nọ n’elu akụkọ a ka ị gere ihe ndị o kwuru n’uju.