Etu m si eji nri emepụta ihe e ji achọ mma - Victor Nwaeze

- Onye dere ya, Adline Okere
- Ndị mere akụkọ a, Onyeisi Ntaakụkọ
- Ebeg o si, Legọs
- Onye dere ya, Michael Ilediagu
- Ndị mere akụkọ a, Ntaakụkọ
- Ebeg o si, Legọs
- Onye dere ya, Donald Chika Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Ntaakụkọ Onyoonyo
- Ebeg o si, Legọs
Nwa okoroọbịa bụ Victor Nwaeze bi n'Enugwu mepụtara akwa e ji adụ akpa ma nche mmiri, ọlantị na ihe ndị ọzọ e ji achọ mma site n'ihe oriri.
Ahụrụ m ebe e ji nri mepụta akwa, mụ e jiri garri, mkpo akwa nakwa ihe ndị ọzọ emepụta akụrụngwa e ji achọ mma dịka ọla ntị na akwa.
End of Akụkọ ndị gbasara nri na ahụike
Usoro m ji eji nri emepụta akwa
Nwaeze kọwara etu o si eji akpụ emepụta akwa.
O buru ụzọ na gị awụnye akpụ n'efere, wụọ ya mmiri, ma were ite mbara sie ya n'ọkụ obere oge.
Ka akpụ a nọ n'ọkụ, ọ na-awụ ya agba nakwa kemịkalụ ndị ọzọ mere ya bụ akpụ ji wee sitụ ike n'aka.
O mechara ghasaa ya n'efere mbara ka ọ gbakọọ.
End of Akụkọ gbasara ọrụ BBC mebụrụ
Ọ bụghị mgbe mbụ ndị mmadụ jiri nri mepụta ihe e ji achọ mma.
Mana Nwaeze sị na ọ chọrọ iji usoro a, mara na e nwere ihe ọ ga-amụta makwa ji ya mee nke nwereike ịbara ya uru.



