Akwete fabric: Etu ndị Akwete si malite ịkpa akwa
Nwaanyị na-akpa Akwaete bụ Gladys Akuatta kọwaara BBC Igbo etu ịkpa akwa a si malite n'obodo ha.
O kwuru na ọ bụ nwaanyị a kpọrọ Dada Nwakata malitere ịkpa akwa site n'ihe e gosiri ya n'ime nrọ.
Na ọ pụtara n'ihe malite ịkpa akwa a nke nwaanyị ọbụla n'obodo Akwaete bịara mụta ịkpa ya n'oge ahụ.
Gladys gara n'ihu kwuo na ha anaghị akụziri onye na abụghị onye Akwaete etu esi akpa akwa a n'ihi na ọ gaghị amụta ya.
Na nke a bụ iwu e tinyere n'obodo Akwaete gbaa gburugburu.


