Kelechi: E ji m ịkpa isi zụọ onwe m n'akwụkwọ
Kelechi Angela Anyanwu bụ nwata nwaagbọghọ na-akpa isi kwuru na ịkpa isi bụ ihe ọ mụtara n'aka nne ya.
Mgbe ndị BBC Igbo gbara ya ajụjụọnụ, o kwuru na ịkpa isi nyere ya aka n'ịzụ onwe ya n'ụlọakwụkwọ.
O kwuru na ngwaọrụ ya gunyere; isi nwababy, neti isi, mkpa na ihe ndị ọzọ.