Anambra Church Invasion: A mabeghi ndị wakporo ụlọụka n'Aguleri - Uweojii

Anglican

Ebe foto si, Getty Images

Uweojii Anambra Steeti ekwuola na ọ bụ ndị ha na-eche na ha bụ ndị ohi gara n'ụlọụka Anglican dị n'Aguleri merụọ ụkọchukwu na ndị ọzọ ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Haruna Mohammed mere ka BBC Igbo mata nke a.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụghị nwakpo ndị obodo ọzọ mere dịka akụkọ na-efegharị na soshal midia.

Kama na nyocha ka na-aga n'ihu ịmata ndị mere arụ a ma chọpụta ihe bụ ebumnobi ha na mwakpo ahụ.

Ọ sị; "Onweghi onye ga-asị na ọ bụ mwakpo ndị obodo ọzọ mere kama nyocha ka na-aga n'ihu ịmata nke bụ eziokwu."

Mana onyeisi obodo bụ Hipo Onwuegbuke gwara ndi ntaakụkọ na mwakpo a akarịala naanị izu ohi.

O kwuru na ụdịrị ya emeela na nso nso bụ nke ndị nchekwa obodo gbochiri.

Ụlọ ụka St. Phillips

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ụlọ ụka abụghi nke awakporo

Akụkọ pụtara na ngwụcha izuụka na ndị omekaome wakporo ụlọụka St Peters Anglican dị n'Agụleri Anambra Steeti n'ụbọchị 2 ọnwa Julaị.

Na mwakpo a, ha merụrụ onye nkuzi ụlọụka bụ Christopher Chukwu, onye ụkọchụkwụ bụ Akachukwu Ikedilo na ọnye ọzọ bụ Mathew Nwude ahụ.

Ndị omekaome riri mbọmbọ ọsọ tupu ndị uweojii na ndị nchekwa obodo erute ebe ahụ.

Dịka ọ dị ugbua, ndị merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ.

Akụkọ ga-amasị gị: