Church of Nigeria: Anyị kwụ Bishop chụrụ ụkọchukwu na-edina onwe ha n'azụ

Ebe foto si, Getty Images
Ọnụ na-ekwuru isi ụlọụka ukwu nke Anglican bụ ụkọchukwu Folusho Taiwo ekwuola na "Church of Nigeria" kwadoro diocese Arochukwu etu ha si chụọ ụkọchukwu abụọ na-edina onwe ha.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na-ejidere ha n'aka ebe ha na-akwaso onwe ha iko na ọ bụ ihe ziri ezi ka a chụọ ha.
Ụkọchukwu Taiwo kwuru na "Church of Nigeria" akwadoghị nwoke idina nwoke maọbụ nwaanyị idina nwaanyị makana ya bụ agwa na-agbarụ okwukwe ụmụ Chukwu.
O kwukwara na ha kwadoro ya bụ akwụkwọ ozi na-agagharị n'elu soshal midia maka ọchụchụ ụkọchukwu abụọ ahụ.
Cheta na onye nchịkọta Anglican Diocese dị n'Arochukwu/Ohafia bụ Bishop Johnson Onuoha depụtara n'akwụkwọ ozi na a chụọla ụkọchukwu abụọ na-arụ na diocese ahụ n'ọrụ.
Akwụkwọ o zigara ndị ntaakụkọ kpọpụtara aha ụkọchukwu abụọ a.
N'akwụkwọ ahụ, Onuoha depụtakwara na ha nwetere ozi na ụkọchukwu abụọ na-edina onwe ha , ha mee nyocha ma chọpụta na ọ bụ eziokwu.
O kwuru na nke a mere ka ha napụ ha abụọ asambodo ha ji chie ụkọchukwu ma chụpụ ha n'ọrụ ụka.
N'ọnụ ya, "onye ọ bụla ya ndị a na-emekọ ihe ọ bụla kpachapụ anya makana ha nwerike imetọ aha ụlọụka Anglican"










