Ndị mmadụ ebe dị ịcheịche na-echeta ụka ọmụ taa

Ndi otuchristi na uwa nile gbaa gburu gburu na eme emume uka ọmụ taa.
Ha ji ya bụ emume echeta mmemme emere na akwụkwọ nsọ mgbe Jesu Christi jiri mmeri wee banye na Jerusalem ebe ụmụ Israel jiri igu na ọmụ wee tooro ya na-ala.
Na uka ọmụ akara na ututu tata na Saint Michaels Parish Asata Enugu, onye Isi nchu aja bụ Rev fr. Callistus Ani kwuru na ahụhụ n'ọnwụ Jeso nwụrụ na enuobe kwesiri ikuzuri onye otuchristi ọbụla na ume ala dị mkpa na ndụ ha, na ọ bụ site n'inwe ume ala ka Jeso Christi jiri merie ọnwụ wee binie n'ọnwụ.

Ụka ọmụ bụ nke na abịa otu izu ụka tupu emee mmemme ụka Easter.
Nsukka
Bishop nke Catholic na elekọta Nsukka diocese bụ Godfrey Onah agwala ndị Naijiria ka ha ñomie ume ala Jeso nwere nke mere ka ọ nwụọ ọnwụ na elu obe dịka ana eme emume uka ọmụ tata
Onah duru ndị ụka ji ọmụ na obu ha gbagharịa na gburugburu St Theresa's Cathedral Nsukka iji cheta ụbọchị ụmụ Israel tọrọ Jeso ọmụ ka ọ na agbata Jerusalem.
Akụkọ ga-amasị gị:








