A nwụchiela Bishọp ụka Katọlik maka imefu ego ụka

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii nwụchiri Bishọp Jose Ribeiro bụ Bishop ụka Katọlik nke obodo Formosa dị na Brazil maka mmerụaka.
A na-ebo Ribeiro na ụkọchukwu isii ndị ọzọ ebubo na ha mefuru dola puku nari isi nke a na-kọtara na obodo atọ dị nsọ n'isi obodo Braasilia.
Dịka ndị nyocha sirikwuo, ego ndị bụ ego a nakọtara na oge onyinye, agbamakwụkwọ n'ime mmirichukwu.
Ndị uweojii na-ekwu na ha naele anya inwuchị ndị ọzọ ebubo metụtara.
N'aka nke ọzọ, n'ala Naijiria, Achịbishọp ụka Katọlik na Owere bụ Anthony Obinna etiela mkpu na ndị otu gọọmenti na-achị Imo Steeti na-eyi ya egwu imemila ya.
O kwuru na nke a bụ n'ihi na o kwugidere mbọ Govanọ Rochas Okorocha na-agba ịhụ na ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu banyere ọkwa Gọvanọ n'afọ 2019.
Achịbishọp kwuru nke a n'akwụkwụ ntaakụkụkọ nke ụka Katọlik na-ebibuta n'Imo a kpọrọ 'Leadership.'
Ọ gara n'ihu kwue n'ụka agaghị agba nkịtị ihe a na-emebi dị ka o si dị n'Imo Steeti ugbua.
N'izu ole na ole gara aga, n'akwamozu ebe achbishọp na kwuo na Govanọ Okorocha enweghị ikiike ikwu onye ga-anọchhị ọkwa Govanọ na ọ pụọ n'ọchịchị, na ọ bụ ndị ndị mmadụ ga-ekwu, nke mere ka ndị otu Ugwumba bụ otu na-akwado maka ịbanye n'ọkwa ọchịchị nke Uche Nwosu bidoro ịma achibishọp aka n'ihu.
Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru na onye ndụmọdụ nke Gọvanọ n'ihe gbasara ntuliaka bụ Steve Asinobi,kporo ndị ntaakụkọ ebe ọ nọ kwue na ha agaghị eji nwayọọ so Achibishọp Obinna' dịka Ikedị Ohakim siri mee n'poge ọchịchị ya.











