Anwụlụ na oke isi achụọla ndị mmadụ ọsọ

Ebe foto si, Getty Images
Ndị bịrị na mpaghara Ikosi, Isheri ma ọ bụ Ketu na Lagos steetị na-aṅụ ajọ ịsị si n'ebe ndị gọọmentị na-aga itufu ahịhịa a kpọrọ Olososun dumpsite n'Ojota.
Enugu Steeti nwere nke a ha n'okpokoro ụzọ awara awara si Enugwu ga Port Harcourt.
Ajọ isi n'apụta n'ebe ndị a ka nkụ nke nke na Lagos, ụfọdụ ndị bị n'ebe a akwapugo n'ihi oke isi.
Na Lagos, akụkọ kwuru na otu nwata nwụrụ makana onweghị ike iku ume n'ihi na anwụlụ sị ebe a juputara ebe niile.
Maka ihe a, Gọvanọ Lagos bụ Akinwunmi Ambode emechiela ebe a ana-atufu ahịhịa.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe ndị mmadụ na-ekwu
Mana oke isi ahụ ka dịkwa nakwa ndị mmadụ biri na-ebe a.
BBC Igbo kpọrọ otu nwoke akpọrọ Samuel Osaze bị bụ ebe a n'elu ekwentị.
O kwuru na awụlụ na-esi ebe a na-apụta bụ ihe na-bute nnukwu ọrịa.
"Awụlụ a na-apụta makana gọọmentị na-agba ebe a ọkụ oge ọbụla. Ụnyahụ mgbe m nsị okporo ụzọ ịkọsị na-aga be m, nnukwu awụlụ juputara ebe niile n'ebe ahịhịa a"

Ebe foto si, Getty Images
Otu dibia bekee, Dkta Ikechukwu Mgbolu kwuru na anwụlụ si ebe a na-etufu ahịhịa na-ebute ọrịa dị iche iche dịka ọnyụnyụ na ọgbụgbọ (Cholera), Taifọd, ịba(malaria) na lasa fiva.
O kwukwara na ndị nwere ọrịa ashịma(asthma) anaghị enwe ike ibi nso ụdị ebe a.
Mgbolu kwuru:"Nnukwu anwụrụ a na-ebụte ọrịa ngụgụ elu nke a kpọrọ 'upper respiratory infection' na bekee nihi ajọ ikuku kabọn monozide dị n'ime anwụlụ."
Osaze kwuru na isi a a na-ekweghizi edi n'etiti ọnwa Maachị na Ọgụsụtụ afọ niile maka oge a bụ oge udummiri.

Ebe foto si, Getty Images
Osaze kwuru, "Onweghị obodo ndị mepere anya na-agba ebe a na-etufu ahịhịa ọkụ ugbua makana ha mara na omume dị otu a na-ebute nnukwu orịa.
"Gọọmentị kwesịrị ịzụ ihe a akpọrọ incinerator na bekee bụ igwe eji agba ahịhịa ọkụ."
Gọvanọ Ambode ekwuola na agaghị na-atụfu ahịhịa ọbụla ebe ahụ ọzọ maka ọrịa di iche iche ọ na-ebuta.
Ọ dị zị ndị steetị ndị ọzọ n'aka ikwu ihe ha ga-eme ebe ntufu ahịhịa dị n'etiti obodo ha.










