Ruga Settlements: Ndị ugwu atụzịla anyị aka n'ihu' - Ọgbakọ ndị Igbo

Ndị eze

Ebe foto si, Google

"Association of South Eastern Town Unions" asaala mmaja ọgbakọ ndị ugwu majara gbasara atụmatụ ruga.

Ha dọkwara aka na ntị sị onye Igbo ọbụla eresila onye ọbụla ala buru ibu.

N'otu aka ahụ Wole Soyinka nakwa Ooni na-achị Ife bụ Oba Ogunwusi adụọla ụmụ Naịjirịa ndụmọdụ gbasara ya bụ atụmatụ.

Ha sị ndị mmadụ mee ihe niile dị n'ike ha ịchekwa ala nna ha n'ebe rugu nọ.

Na mba ofesi

Kyriakos Mitsotakis

Ebe foto si, Reuters

Mba Greece enwetala Praim Minista ọhụrụ bụ Kyriakos Mitsotakis mgbe otu ya bụ New Democracy meriri ntụlaịka ala ahụ.

N'Afrịka, Mandla Maseko na-akwado ịbụ onye Afrịka mbụ ga-abụ ihe Bekee kpọrọ Astronaut anwụọla na mberede ọgbaa tumtum.

N'egwuregwu,

African football teams and dia link with animals
Nkọwa foto, .

Dịka akụkọ pụtara na ọtu CAF mere Chidozie Awaziem nakwa Kenneth Omeruo nyocha maka ọgwụ ike, BBC achọpụtala nke bụ eziokwu.

Onye ntaakụkọ BBC bụ Oluwasina Okeleji kwuru na ya bụ nyocha abụghị ihe ọhụrụ.

O kwukwara na emere ya ndị ọgba bọọlụ ndị mba ndị ọzọ a họpụtara.

"O nwebeghi onye dara nyocha a kemgbe ebu ụzọ malite ya bụ asọmpi AFCON" ka o kwuru.

Nke a bụ ya ugboro anọ ha na-eturu ugo na ya bụ asọmpi kemgbe amalitere ya n'afọ 1991.

Ebe foto si, Getty Images

Mba Amerịka ebuliela ịkọ mbaụwa ụmụnwaanyị nke ụgbọrọ anọ dịka ha ji ọkpụ goolu abụọ asataghị otu merie mba Netherlands mgbe ha zutere onwe ha.

Nkeji nke ututu a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo, Erosion: 'Ndị ụka gbutuchara ukwu osisi mere ka idemmiri bakwute anyị'