Unemployment in Nigeria: Ọrụ asaa ị ga-ebidonwu na be gị ga-eme gị 'ide ji ego'

Ezinaụlọ

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ọrụaka ndị a ga-ekwu maka ya n'akụkọ a ga-enyenwu gị ego n'ime ụlọ gị.

Ngalaba na-ahụ maka ndekọ ọnụọgụgụ na Naịjirịa bụ "Nigeria Bureau of Statistics" si kwuo, ọnụọgụgụ ndị enweghi ọrụ na-arịgo kwa afọ.

Nchọpụta a mere ka ọtụtụ ndị na-agba mbọ ibido akaọrụ na-abụghị ọrụ bekee ha ga-eji na-emegharị aka nakwa na-akpata ego.

BBC Igbo kpọkuru otu onye ọkachamara n'ihe gbasara achụmnta ego bụ Amarachi Nwankwo, onye kọwara ọrụaka iri ị ga-ebidonwu n'ime ụlọ gị.

Lee akaọrụ ndị ahụ ebe a:

1) Ilekọta ụmụaka:

Ọtụtụ ndị agaghị ahụta nke a ka ọrụ, mana ị ma na ị ga-ejinwu ilekọta ụmụaka ndị enyi gị, ụmụnne gị nakwa ndị agbataobi gị kpara ego?

Onye na-eku nwa

Ebe foto si, Getty Images

A na-eme ya bụ ihe bekee kpọrọ "babysitting" n'obodo oyibo, gịnị ga-akwụsị gị iji ya akpata ego na Naịjirịa?

Ebe o si ka mma bụ na ị ga-anọ n'ụlọ gị nwee ike iji ndụ gị mere ihe ka ị na-elekọta ụmụaka ndị e tinyere gị n'aka, ma narakwa ego tinye n'akpa.

2) Ikuzi nkuzi:

Ị bụ "nwa teacher"? Mba! Mana ị ma na ị ga-abụnwu?

Ụmụaka na-amụ akwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ bekee anaghị enwe efe enyere ụmụ ha aka ime ihe ndị nkuzi nyere ha rụọ n'ụlọ, mana ọ ga-amasị ha ịkwụ ụgwọ ka onye ọzọ nyere ha ụdịrị aka ahụ

Nkuzi nke a abụghị ịga mepee ụlọakwụkwọ, kama ọ bụ ikuziri ndị mmadụ ihe ndị ị ma maka ihe ndị dị iche iche.

Ọ bụrụ na ị chọghị ime nke ahụ, i nwereike na-akuziri ụmụaka akwụkwọ ma ha si n'ụlọakwụkwọ bata bụ nke ndị bekee kpọrọ "home lesson".

Ebe o si ka mma bụ na ị ga-emenwu nke n'ofu akụkụ n'ime ụlọ gị, narakwa ego gị.

3) Ire ihe na soshal midia:

Ọ bụrụ na ị maghị na a na-erezi ihe na soshal midia ugbua, mara na ị ka bi n'okpuru nkume.

Etu e si akpọsa akwa na soshal midia

Ebe foto si, Cubesfashions

Ndị mmadụ na-ere ọtụtụ ihe dịka akwa nke ọhụrụ nakwa ọkịrịka, akpụkpọụkwụ, nri nakwa ngwa nri, mmanya, ụgbọala, nka na ihe ndị ọzọ n'elu soshal midia.

Ebe o si ka mma bụ na ị ga-anọnwu n'ime ụlọ gị na-akpata akụ a site n'ire ihe ndị dị iche iche.

4) Ịkọ akwụkwọ nri:

Ị ma na ọ bụghị naanị mgbe ị nwere nnukwu ugbo ka ị ga-esinwu na ya kpata ego?

Onye na-akọ ubi

Ebe foto si, Getty Images

Ọ bụrụ na ị nwere ọbụrụgodi obere ubi, ị ga-ejinwu ya kọta ihe ndị dịka akwụkwọ nri.

I si n'ime ụlọ gị na-ere akwụkwọ nri ndị a na ngwa nri ndị ọzọ, ọ ga na-enye gị ego ị ga-ejinwu lekọta onwe gị.

5) Ịkpa isi na Ịkpụ isi:

Ị ma na ị nwereike ị na-akpa isi n'ime ụlọ gị na-akpata ego?

Ịkpa isi

Ebe foto si, Getty Images

Ị malite ịna onye agbataobi gị ahụ maọbụ enyi gị nwaanyị ahụ ego tupu ị kpaa ya isi, ị ma na ọ ga-eme ka ego na-adị gị n'aka?

Aha onyonyo, Kingsley na-akpa isi

Ị kpaa maọbụ kpụọ ha isi ọfụma, ha ga-edutere gị ndị ọzọ, makana Igbo na-ekwu na "ahịa ọma na-ere onwe ya".

6) Isụ akwa:

Ị ma na ị ga-ejinwu ịsụ akwa nweta ego ị ga-eji fọjuo akpa gị?

Onye na-asa akwa

Ebe foto si, Getty Images

Makana ọtụtụ ndị ọrụ bekee anaghị enwe ohere, ọkachasị ndị bi na Legọs bụ ndị ahịrị na-egbu oge, inweta ohere ịsa akwa na-ara ụfọdụ ahụ.

Ebe a ka ị ga-esi kpata ego gị maọbụrụ na ị malite ịnapụta ha ego tupu ị saara ha akwa.

Elela anya ebe tere aka, bido n'agbataobi gị.

7) "Blogging"

Ị ma ego ole ị ga-anọnwu n'elu akwa gị kpata ma ọ bụrụ na ị malite ide ihe n'elu igwe kọmputa gị?

Jụọ Linda Ikeji na ndị ọzọ dịka ya etu ha si si n'ide ihe malite ịkpata ego, ma bakwaa ọgaranya.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

Malite otu n'ime ihe ntuziaka ndị a nakwa ndị ọzọ gụnyere ịkwa akwa, ire ngwa nri, ịzụ ọkụkọ nakwa ihe ndị ọzọ, taa, ka ị nyere onwe gị aka makwa tinye ego n'akpa gị.

Akụkọ ga-amasị gị: