Arsenal vs Napoli: Onye ga-ata ikikere eze taa?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ dị mkpa:

Ndị Arsenal na Chelsea

Ebe foto si, Getty Images

Onye ga-ata ikikere eze maọbụ nọrọ n'ọṅụ mgbe Chelsea, Arsenal, Napoli na ndị ọzọ ga-agba asọmpi Europa League taa?

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Azịza ajụjụ a dị ndị na-akwado ha n'obi ka ha na-echebiri ihe a ga-agbata.

Chelsea ga-ezute Slavia Prague bụ ndị a na-atụ anya na ha ga-emeri, ebe Arsenal na Napoli ga-esukọta mpi.

Ihe Naịjirịa chọrọ n'aka Sudan ugbua

Gọọmentị Naịjirịa etinyela ọnụ n'ihe gbasara nchụpụ a chụpụrụ Onyeisiala mba Sudan bụ Omar-Al-Bashir n'oche ọchịchị.

Onyeisiala Omar al-Bashir

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Onyeisiala Bashir wezụgara iwu ala ahụ nakụkụ n'ọnwa Februwarị

Geoffrey Onyeama bụ minista na-ahụ maka mmekọ Naịjirịa na mba ọzọ, gwara BBC na Naịjirịa na-atụ anya na ọgụ na mgba agaghị adapụta.

O kwukwara na ha ga-achọ ka Sudan mee ngwangwa chịkọta onwe ha ọnụ dịka iwu obodo ha kwuru.

Ụkwa dagidere Diego Costa

Ị ma Diego Costa na-agbara Athletico Madrid bọọlụ? Amachiela ya iso gbaa bọọlụ n'egwuregwu asatọ maka mkparị ọ kparịrị ogbu opi ụbọchị ha na Barcelona zutere na La Liga.

Ndị Uweojii akwala ndị otu ha teta n'ụra

Ndị uweojii Naijiria

Ebe foto si, NPF/Twitter

Nkọwa foto, Ndí uweojii Naíjiría akwadola ílúsa ndí Omeketereihepúújó agha

Onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed A. Adamu agwala ndị otu ya bụ ndị riri mperi n'ọrụ ha gbaa mbọọ chegharịa ma chigharịa.

Adamu kwuru nke a mgbe ọ nọ n'ọgbakọ ha kpọrọ maka ịtụpụta amụma ọhụrụ ga-enyere ha aka ịbaso ndị ekperima, ndị ntọ nakwa ndị ọmekataraihepụụjọ agha na Naịjirịa.

Nwụchi Julian Assange

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ndị uweojii anwụchiela Julian Assange n'obodo London.

Julian Assange

Ebe foto si, Reuters

Minista na-ahụ maka ndị ọbịa na ndị mbịarambịara na mba Briten bụ Sajid Javid gwara BBC na nke a bụ eziokwu.

"Ka ọ dị ugbua ọ nọ n'ụlọ mkpọrọ ndị uweojii" ka Javid kwuru.

Ụlọọrụ ndị Sineti Naịjiria

Ebe foto si, @NGRSenate

Ndị omeiwu kwekọrịtara ịga n' ihu na iwu ga-agbanwe Iwu Naijiria nke afọ 1999 nke atụpụtara n' afọ 2018.

Ha lebanyere kwara anya na iwu ga-akwalite mmmepụta ngwahịa (Industrial Development Amendement Bill) nke afọ 2018.

Iji kụpụ ọjụjụ onyeisiala ibinye aka n'ibibụta iwu ọhụrụ, ụzọ abụọ na ime atọ, ya bụ mmadụ 73, ndị omeiwu ga-akwado ya.

Na nkọwa ya, oge ọ na-ewepụta ozi nke kọmiti lebanyere anya na iwu ndị a, onyeisioche kọmiti ahụ bụ David Umaru kwuru na ha lebanyere anya n'ihe ndị onyeisiala rụtụrụaka mere o jighị kwado iwu ndị ahụ.

N'okwu ya onyeisi Sineti bụ Bukọla Saraki kpọọ okụ na steeti ọbụla nwe ndị uweojii nke ha ji belata nsogbu chekwa dịka ọ gbalitere elu na Zamfara nakwa ebe ndị ọzọ.

Akụkọ ga-amasị gị: