Ọfọ ndị sineti: Ndị uweojii ekwuola na ụfọdụ sineti so kpa nkata ahụ

Ebe foto si, Nigeria Senate/Twitter
Onyeisi ndị uweojii na-elekọta ụlọ omeiwu Naịjirịa aha ya bụ CSP Sulu-Gambari Abdul ataala ndị nọ n'ime sineti ụta maka mwakpo e mere n'ụlọ sineti ma zuru ọfọ ha ụbọchị epurel 18.
Abdul kwuru nke a oge kọmiti sineti na nke ndị ụlọomeiwu nke nta na-enyocha ya bụ ihe mere gbara ya ajụjụọnụ.
Dịka o si kwuo, ihe mere n'ụlọomeiwu bụ maka izu ọjọọ na nkata dị n'etiti ndị nchekwa na ụfọdụ ndị sinetị.
O kwuru na ndị uweojii na-eji egbe nọ n'ime ụlọ sineti kwa ụbọchị emeghị ihe ọbụla oge ndị omekome ahụ batara.
N'okwu ya, "Ụbọchị epurel 18 oge ọ na-akụ ihe dịka elekere 11 nke ụtụtụ, a kpọrọ na o nwere ndụ na-eme ngagharị iwe n'ọnụụzọ na-abata ụlọomeiwu, e jiri m ngwa ngwa gaa ịgwa ndị ahụ okwu oge a gwara m na o nwere ndị bu ọfọ sinetị agbapụ ọsọ".
"Akpọrọ m ndị nọ n'ọnụụzọ niile ka ha ghara ikwe ka onye ọbụla pụọ maọbụ bata mana mmadụ atọ bịakwụtere m na ha bụ ndị nchekwa ka m nye ha ohere ka ha laa".
"Ọbara m hụrụ n'akwa ha mere ka m na-enyo ha enyo, m we nye iwu ka a nwụchie ha, n'ihe niile, mmadụ isii ka a nwụchiri ụbọchị ahụ ma nyefe ha n'ịsị ụlọọrụ ndị uweojii n'akụkụ ọgwụ nsị anyị natara ha".
"Ọzọ, a natarakwara otu ụgbọala Prado na-enweghi ihe e dere ya nakwa otu ụgbọala Toyota Hilux ka ndị uweojii kpọchiri," ka o kwuru.
Na nzaghachi, onyeisi kọmiti na-em nyocha ahụ bụ sintọ Bala Ibn N'alla gwara ndị uweojii ahụ ka ha weta akwụkwọ ndị uweojii ha na-edebanye aha ndị omekome na ihe ha mere.
O nyekwara iwu ka ha nye ndị kọmiti ahụ ụfọdụ n'ime akwụkwọ ahụ nke foto ndị a nwụchiri na ebe e dere ebe a kpọgara ha dị.
Cheta na ọgbakọ ndị sineti kpụrụ ụkwụ n'ala ụbọchị Epurel 18 afọ a 2018 oge ndị omekome wakporo ụlọomeiwu ahụ wee zuru ọfọ ha.
Ndị sineti dere akwụkwọ katọọ ya bụ ihe ma kwuo na ọ bụ arụ megide ala Naịjirịa ma bụrụ izu iji kwatuo otu ngalaba nke gọọmenti etiti.
Ha bokwara otu sinetọ na-anọchi ndị Delta sentraal bụ Ovie Omo-Agege ebubo na o du ndị omekome ahụ wakporo ụlọomeiwu ma buru ọfọ ha.
E mechara nwụchie ya bụ sinetọ mana o kwuola na onweghi ihe ya mere, e mechara ndị uweojii hapụ ya.
Ndị uweojii mechara chọa ọfọ ahụ e zuru n'okpuru akwa ụzọ ma weghachitere ya ndị sineti na-agafechaghi otu ụbọchị ihe ahụ mere.

Akụkọ ga-amasị gị:











