Anambra state: Ọgbaghara dị n'etiti ndị na-achị ehi na Anam akwụsịla - Kọmishọna mgbasa ozi
Akụkọ ka mkpa na mgbede a

Ebe foto si, Getty Images
N'Anambra, kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Don Adinuba na steeti ahụ ekwuola na gọọmenti edoziela esemokwu mere n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị na-achị ehi n'izu ụka gara aga n'Anam.
Adinuba kwuru na ọ bụ site na mkparịtaụka ndị ọnụ na-eru n'okwu na steeti ahụ na ndị Anam ebe nsogbu a mere nwere ka eji gbonwụo mwakpo a.
O kwukwara na ọ bụ ndị ọchị ehi si obodo ọzọ bata Anam kpara ya bụ mkpa mkpa.
Ọzọ,

Ime njem na-aga n'ihu ugbu a n'ọdụugboelu Sam Mbakwe dị n'Owere, na-agbanyeghi ihe mberede ọkụ ọgbụgba mere ebe ahụ n'ụbọchị Monde .Ihe mberede a nke mere n'elekere abụọ nke ehihie, tinyere ọtụtụ mmadụ nakwa ndị njem n'ọgbaghara.Anya hụrụ ka osi mee gwara BBC Igbo na ihe mberede a malitere mgbe ndị na-ere ahịa n'akụkụ ebe ahụ nọ na-enwe nzukọ maka ọkụ ọgbụgba.Mbọ BBC Igbo gbara ịnu ọnụmmiri okwu onyeisi ọdụụgbọelu ahụ bụ Rejoice Ndudinachi kụrụ afọ n'ala n'ihi ọ juwara isi na ya agaghị ekwu ihe ọbụla.
Na Borno

Ebe foto si, Getty Images
Anyị akpọpụtala ndị nile bi n'obodo Jakana dị na Bono steeti ka anyị chekwa ha ma nwe ohere wakpo ndị Bokoharam juru ebe ahụ
Ụlọrọ mgbasa ozi Punch depụtara na ọ bụ Abdulkadiri Ibrahim bụ onụ na-ekwuru NEMA kwuru nke a.
Ibrahim kwuru na-akpọgara ha n'obi ndị gbara ọsọ ndụ dị na Obodo Maiduguri.
N'ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Aka chiburu South Africa bụ Jacob Zuma agọrọla isi ya.
Ọ na-ekwu na aka chiburu Libya nwụrụlanụ bụ Muammar Gaddafi enyeghị ya ego ruru nde dọla iri atọ iji gbapụta ya n'ulọikpe mgbe ọ dị ndụ.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, @realFemiOtedola
Akajiakụ Otedola awụsala Christian Chukwu Dọla?
Ọ gwara ụlọọrụ mgbasa Ozi cable na o mere nke a maka etu Christian Chukwu onye bụbụ onye nchịkọta Super eagle si wepụta obi ya fee ala nna ya n'oge gara aga.

Ebe foto si, Getty Images
Ebe a ga-amata n'etiti Mancity na TottenHam nakwa Leceister City na Porto Fc, onye ga-eji ibe ya gwọrọ ajụ n'asọmpị Champions League nke mgbede a.
Nkeji
Ihe nkiri
Akụkọ ka mkpa n'ụtụtụ a
Mmadụ asaa nwụrụ

Ebe foto si, The Nationoline
Ka anyị bata na Ondo steeti ebe ndị omekome gburu mmadụ asaa ebe ha gara izu ohi na ụlọakụ First Bank dị n'Idoani, bu obodo dí n'okpuru óchíchi Ose.
Ndị isiekwe ọnwụ a bidoro gbawa egbe aghara aghara, ebe ha ji ogbunigwe gbarie ọnụụzọ ya bụ ụlọakụ were buru ego waa.

Ebe foto si, HOPE UZODIMMA FACEBOOKPAGE
Hope Uzodimma agawa ụlọikpe.
Ọ sị ụlọikpe kagbuo mmerị Inec nyere Emeka Ihedioha maka nrụrụaka ọ sị na-emere ntuliaka ọkwa gọvanọ na ọnwa Maachi.
Izrel na ntuliaka ha

Anyị e sị Ondọ bata mba Isreal ebe Prime Minister Benjamin Netanyahu sọ na-azọ ọkwa ọnyeisiala nke ugboro ise ya.
A ga-anwuru ya n'ọchịchị?
Netanyahu nwere nchekwube na ọ ga-apụta dika onyeisiala agbanyeghi ebubo mpu na nrụrụaka ndi uweojii mba ya boro ya.
Super Falcons a narala ọnụ goollu abụọ n'aka Canada

Ebe foto si, NFF/twitter
N'egwuruegwu, otu egwu bọlụ mba Canada ejirila ọkpụ abụọ asatara otu nyụọ otu Super Falcon nke Naịjirịa anya n'egwu bọlụ enyi na enyị ụmụnwaanyị ha gbara ụbọchị Monday na Canada.
Nwafọr Desire Oparanozie ji otu ọkpụ gbara isi onwe ya na ya bụ egwuruegwu.











