2019 Election: 'Ndị Abịa na-eru uju maka ntuliaka e mere'

Alex Otti nke APGA

Ebe foto si, Alex Otti

Nkọwa foto, Alex Otti nke APGA

Ọnụ na-ekwuru Alex Otti bụ onye zọọrọ okwa gọvanọ n'Abia steeti n'okpuru pati All Progressives Grand Alliance (APGA) bụ Maazị Kasie Uko tinyerela ọnụ n'oku onye nnyemaka Okezie Ikpeazu gwara onyeisi ya.

Maazị Uko jụrụ: "kedụ ihe na-atụ ha (PDP) egwu maka na Otti gara ụlọikpe pụrụiche ị sị ka enyocha ya bụ ntuliaka?"

Ọ sị na ọ bụ aka ọrụ ndị otu pati ahụ ịkọ onye ọbụla pụtara ịmezi obodo ọnụ.

Maazị Ifeanyi Umere na-arụrụ aka na-achị Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu ọrụ dịka onye nnyemaka pụrụiche sị Alex Otti ya biko gbara ọgwụ ya ṅụọ.

Umere kwuru nke a mgbe ọ na-azahachi okwu gbasara ịkpụpụ n'ụlọikpe nke Alex Otti kpụpụrụ Gọvanọ Ikpeazụ ebe ọ na-arịọ ka ụlọikpe doo doo doo kagbuo mkpebi Inec maka ntuliaka nke gọvanọ emere n'ọnwa Maachi maka okpuru ọchịchị iri na ise (15) nke steeti ahụ ọ sị na nrụrụaka gbarụrụ usoro eji eme ihe.

Umere sị na "ịga ntuliaka amarala Otti ahụ" ebe ya bụ akwụkwọ ọgbara n'ụlọikpe gosiri ya ka ọnye "enweghị ukwu na nghọta".

Maazị Uko sị na ya bụ ọnụ a na-akọ Otti enweghị isi ma ọlị.

Ọ sị na ndị Abia aṅụghị ọṅụ ụbọchị akpọrọ mpụtara ntuliaka ahị nke gosiri na ndị Abịa nọ n'iru uju.

Akụkọ ga-amasị gị