Man United vs Barcelona: A kpọgidela Man U n'obe Old Trafford

Ebe foto si, Getty Images
Barcelona ekpoteghi aja juru ha aka n'asọmpi ha na Manchester United gbara dịka ọtụtụ ndị mmadụ tụrụ anya.
Man United bu ụzọ nwale Barcelona na nkeji isii site na 'free kick' Marcus Rashford gbara, mana mgbidi Barcelona wuru gbochiri nke a ịgafe.
Na-atụfughi oge na nkeji iri na abụọ, Leo Messi gbara bọọlụ site na nkọrọ, ebe Suarez mara ya isi dịka ọ na-achọ ịba n'ime neetị.
Mana Luke Shaw nke Man United ji ụkwụ kukpuo ya n'ime neetị ndị otu ya.
Ogbu opi gụpụrụ goolu ahụ na mbụ kwuo na Suarez bi ebi n'ụlọ ndị Man United, mana nyocha ihe onyonyo VAR gosiri na bọọlụ ahụ bụ goolu n'ezie.
Ndị Man United bịara kee nkwụcha nke mere o ji raa Barcelona ahụ ịkpa ike.
Na nkeji iri atọ na otu, Chris Smalling nke Man United ji mpi aka kpọrie Messi imi, ọbara si ya n'imi na-apụta.
Mana Messi mechara bata n'ọgbọ egwuregwu mgbe e nyochara ya ahụ mata na onweghi oke mmerụ ahụ.
David de Gea gbaara onwe ya aka ahịa n'igbochi bọọlụ si n'aka Messi na Philippe Countinho.
Mmeri a e meriri Man United ga-eme ya ugboro anọ na-eso ibe ya, n'ime asọmpi ha gbarala n'okpuru Ole Gunnar Solskjaer dịka onye nchịkọta ha.
Cristiano Ronaldo nyere goolu nke 125 ya n'asọmpi Champions League

Ebe foto si, Getty Images
N'aka nke ọzọ, Cristiano Ronaldo gbara aka ahịa dịka o nyere otu goolu ka Juventus na Ajax zutere.
Mana David Neres nke Ajax sara goolu ahụ dịka agba nke abụọ na-amalite.
Nke a mere ya otu ọkpụ ha nyeritara onwe ha.
N'izuụka na-abịa Barcelona ga-anabata Man United na Camp Nou ebe Juventus ga-ele Ajax ọbịa na be ha.
Akụkọ ga-amasị gị:












