Wolves vs Man United: Ha agwọọla 'nwunye ha' Man Utd ara ọzọ

Lukaku na Pogba

Ebe foto si, Getty Images

Ike ndị Manchester United na-akpa nyụrụ ka ọkụ ka ha zutere "di ha" bụ Wolverhampton n'asọmpi Premier League; nke ugboro abụọ n'ime izu atọ.

Goolu Diogo Jota nke Wolves nyere na nkeji 25 na nke Chris Smalling nke Man Utd ji ụkwụ ya gbakpuo na neetị ha na nkeji 77, zuru ikpugide Man Utd nkata ka onye aghụghọ na ya bụ egwuregwu bọọlụ.

Ebe o si ka njọ bụ na ọ dịka ọ bụ Man Utd bu ụzọ chọọ okwu, ka Scott McTominay bu ụzọ gbakpuo bọọlụ (goolu mbụ ọ na-enyere ndị Man Utd) na neetị ndị Wolves na nkeji 13.

Nke a tọghapụrụ ụkwụ ndị Wolves, ha ji chagide Man Utd ọkụ ruo na ngwụcha egwuregwu ahụ.

Raul Jimenez

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Raul Jimenez gosikwara na ọ bụ ugwu nyịrị dike, ka o si tinye onwe ya na bọọlụ, mere ka akaọrụ ya dịrị na goolu abụọ a ndị Wolves nyere.

Ashley Young na-agbara Man Utd bọọlụ mechara meta ihe e ji chụpụ ya na nkeji 57, ka o nwetara akwụkwọ edo edo abụọ maka igbatu Jota ugboro abụọ n'ime nkeji ise.

Mmeri e meriri Man Utd emeela ka ha na Tottenham jiri pọịntị 61 hara n'ogogo Tebulu Premier League, ebe Arsenal ji pọịntị abụọ na-aga ha.

Cheta na Wolves gwọrọ Man Utd ara mgbe ha zutere n'asọmpi Iko FA n'ụbọchị 16 nke ọnwa Maachị.

Ajụjụ onye ọbụla kpụzị n'ọnụ ugbua bụ "ihe a ọ bụ ụkwụ nnama ji aga Aba?" ka Man Utd na-akwado izute Barcelona n'asọmpi Champions League n'ụbọchị 10 nke ọnwa Epreelụ a?

Akụkọ ga-amasị gị: