Arsenal vs Man United: Ụwa niile ahụla ọtọ Man Utd taa

Pogba

Ebe foto si, Getty Images

Ndị Man Utd riri aja nsuru ọkụ n'aka otu Arsenal ka ha bịara 'ileta' ha n'ụlọ ha n'Emirates.

Goolu abụọ Granit Xhaka nyere n'ime nkeji 12 e ji bido bọọlụ na nke Pierre-Emerick Aubameyang nyere na nkeji 69, zuru ịtụnye Man Utd n'ime ala, wụkwasị ha aja ụrọ.

Enwere oge Romelu Lukaku riwara ọnụ n'ihu poostu ndị Arsenal, n'ime ọkara nke mbụ.

Nke a bụ mmeri mbụ a na-emeri Ole Gunnar Solskjaer na Premier League kemgbe o ji malite ịchịkọta Man Utd.

Mmeri a emeela ka Tottenham nọ n'ọkwa atọ jiri naanị otu pọintị agafe Arsenal, ebe Arsenal rịferela Man Utd na tebulu Premier League.

Ajụjụ bụzị "Arsenal ọ ga-anọ n'ọkwa anọ nke mbụ mgbe afọ a ga-agwụ?"