Rennes vs Arsenal: E jirila Arsenal chụọ aja ndị mmụọ

Ebe foto si, Getty Images
Rennes gosiri Arsenal nkarị na Roazhon Park taa ka ha tichara ha egwu fọọ ha aja n'ọnụ.
Goolu atọ Benjamin Bourigeaud, Nacho Monreal na Ismaila Sarr nyere na ya bụ egwuregwu zuru ime ka ndị Arsenal chee echiche ndụ ha n'abalị a.
Na nwaafọ Naịjirịa bụ Alex Iwobi, nyere goolu n'ime nkeji anọ e ji malite ịgba bọolụ, ezughi inye ha mmeri onye ọbụla nọ na-atụ anya ya.
N'ime nkeji 41, onye Arsenal, Sokratis Papastathopoulos, metara ihe e ji chụpụ ya ka ọ natara akwụkwọ edo edo abụọ.
Nke a mere ka ndị Arsenal fọ naanị iri n'ime ọgbọ egwuregwu; mere ka "ọgwụgwọ nsọ" ha biri ọkụ.
Rennes ga-ezute ha na be ha n'Emirates n'izu ọzọ na-abịa, n'ụbọchị 14 nke ọnwa Maachị.
Akụkọ ga-amasị:






