Election 2019: Onye na-ata ndị APC ndị a amusu?

Ayogu Eze,Tonye Cole

Ebe foto si, Ayogu Eze,Tonye Cole

Otu pati dị na Naijiria ruru iri asaa na otu mana o nweghị nke n'ime ha nwere nsogbu enweghị onye ga-anọchite anya ha n'azọm ọkwa gọvanọ na steeti dị iche iche dịka APC.

Ndị APC agaghị enwe ndị ga-aza aha ha dịka gọvanọ n'ọtụtụ steeti gụnyere Rivas, Cross Rivas na Zamfara steeti.

Nke a na-eme dịka ọgbaghara jupụtara na pati ahụ dịka ha mechara ntuliaka imeụlọ ha n'afọ 2018.

Ihe nke a pụtara dịka ọkaiwu Goddy Uwazuruike siri kọwaa, bụ na "onye ọbụla tụrụ ndị a vootu na ntuliaka a "bụ nkịtị nkịtị."

Aha onyonyo, 'Onye tụrụ Ndị ụlọikpe gbajọọ vootu tụrụ n'efu'

Uwazuruike, onye ọnụ na-erụ n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, kwuru na ndị nwetara ụzọ mgbapụ n'ụlọikpe mkpegharị ka nwere ikpe ma e mecha ntuliaka.

Na e nwere ike ịchụda ha ma ha merigodi ntuliaka.

Na Krọs Rịva

APC enweghị onye na-efere ha ọkọlọtọ na Krọs Riva.

Ụlọikpe chụdara Sinetọ John Owan-Enoh bụ onye ndị APC nyere ọkọlọtọ ha na ntuliaka ọkwa gọvanọ nakwa ndị ọzọ nọ na pati ha ya na ya na-adọ ọkwa.

Gịnị mere nsogbu jiri karịa n'APC dịka o si gbasa ọkwa gọvanọ?

Uwazuruike kwuru na ọ bụ n'ihi na ụfọdụ nwere agba na patị ahụ bụ "eze onye agwala m", na ọ bụ ya butere nsogbu a.

Lee ka ihe si kwụrụ:

Na Rivas steeti

Tonye Cole

Ebe foto si, @TonyeCole1

Na Rivas steeti, APC gba aka, gbara ọtọ; nke a bụ n'ihi na akwụkwọ Inec zipụrụ maka ndị pati dị iche iche na steeti ahụ tozuru ịzọ ọkwa gọvanọ, aha APC adịghị ya.

Nke a na-eme dịka ụlọikpe kagburu aha Tonye Cole bụ onye ndị APC kwuru bụ onye ga-azara ha aha na ntuliaka imeụlọ ha mere.

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja kpebiri na APC lelịrị mkpebi ụlọikpe nyere ya n'ihe gbasara ntuliaka imeụlọ ha, nke mere na ọ kagburu mpụtara ntuliaka.

Na Zamfara

Inec kwuru na APC enweghị onye ga-azọrọ ha ọkwa gọvanọ n'ihi na ezitaghị ha aha onye ha họpụtara ganye na oge e nyere agwụ.

Okwu dapụtara na pati APC na steeti ahụ ka ha mechara ntuliaka imeụlọ ha.

Obi adịghị mmadụ asatọ n'ime ndị zọrọ ọkwa ahụ mma, nke mere ka ha gbaa akwụkwọ n'ụlọikpe.

Mana Enugwu na Taraba steeti zọtara isi onwe ha:

N'Enugwu

N'Enugwu, Inec kwuburu na APC enweghị onye ga-azọrọ ha ọkwa gọvanọ ụbọchị March 9.

Ayogu Eze

Ebe foto si, Ayogu Eze

Nke a na-eme dịka ụlọikpe ukwu nọ n'Abuja chụdara Ayogu Eze dịka onye ji aha pati ahụ azọ na steeti ahụ.

Ụlọikpe nyere iwu ka e were ikike ahụ nye George Ogara, mana ndị isi APC emeghị ya nke mere ka Inec kachapụ aha APC n'akwụkwọ pati ndị ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ.

Mana akụkọ na-eru anyị ntị taa bụ Tọzde, Maachị 7, bụ na ụlọikpe mkpegharị ekwuola na Ayogu Eze bụ onye ji ndị APC n'ọgbọ n'Enugwu na ntuliaka 2019.

Na Taraba

Akụkọ ọnọdụ APC na Taraba steeti gaara adị ka nke Rivas ma ọ bụghị na ha ji ehihie chọwa ewu ojii.

Ụbọchị Wenezde Maachị 6, ụlọikpe chụdara Sani Danladi bụ onye na-aza aha APC na ntuliaka.

Ibrahim Tukur El-sudi

Ebe foto si, Sani Sulaiman

Nkọwa foto, Onyeisioche APC na Taraba, Ibrahim Tukur El-sudi kwuru na pati ha na-enwe ọnụ maka mkpebi ụlọikpe mkpegharị

Mana ngwa ngwa nke a mere, ha gara ụlọikpe mkpegharị ebe dịka onyeisioche APC na Zamfara siri kọwara BBC Igbo, "ụlọikpe mkpegharị wezugara mkpebi nke ụlọikpe ukwu nọ na Jalingo kpebiburu ụnyaahụ, nke kwuru ka onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'aha pati ahụ chịsa ọwa".

Akụkọ ga-amasị gị: