2019 Election: Rochas o ji otu ụkwụ nọrọ n'APC?
Akụkọ dị mkpa

Ebe foto si, @APCWAY2019/bbc
"Ọ bụ nwa m Uche Nwosu nọ na pati Action Alliance ga-achị Imo steeti."
"Mba ọ bụ Hope Uzodimma nke APC ga-azọta oche gọvanọ n'Imo steeti."
Ndọrọndọrọ a mere n'etiti nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari nakwa Rochas Okorocha mgbe nwunye osote onyeisiala Dolapo Osinbajo nọchịtere anya Aisha nakwa ndị otu pati APC ngalaba
ụmụnwaanyị na ụmụ ntoroọbịa gara ịchụ nta vootu na steeti ahụ n'ụbọchị Satọde gara aga.
Ihe ndị ọzọ mere ebe ahụ:
- Okwu Rochas mere ka ndị isi pati APC si na steeti ise dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ si n'ọgbakọ ahụ pụọ.
- Onyeisi ụmụnwaanyị na pati APC bụ Salamatu Eluma rịọrịọ ndị Imo ka ha tụnyere Buhari nakwa ndị otu APC na-azọ oche ọchịchị na mpaghara ọwụwa anyanwụ.
- Okorocha kwuru na ọ bụ Uche Nwosu ga-emeri na ntuliaka na-abịanụ.
- Hope Uzodimma site ọnụ na-ekwuchitere pati APC n'Imo bụ Enyinnaya Onuegbu kwuru na e hibere ya bụ achụmta vootu ka ewe tee ya ule n'ihu.
- Onuegbu kwuru na Okorocha na-alụ ọgụ ka onye dara mmiri nakwa na ọ ga-ada mmiri makana Uzodimma na Buhari ga-emeri na ntuliaka na-abịanụ.
- Mgbe BBC Igbo juru ọnụ na-ekwuchitere uweojii n'Imo bụ Godson Ikeokwu ị jụta ya maka akụkọ kwuru na mgbọ egbe tụtụ ụmụnwaanyị abụọ n'ọgbakọ ahụ , o kwuru na ọ maghị maka ya kama na ọ ga-eme nyocha ma gwa anyị nke bụ eziokwu.
Obiano kwụsị ịkwadọ nghọpụtagharị Buhari - Atiku-Obi Campaign Organisation

Ebe foto si, GovernorObianoFacebook
Otu kpọrọ onwe ha Atiku-Obi Campaign Organisation adọọla gọvanọ Anambra Steeti bụ Willie Obianọ ka ọkwụsị ịna chụrụ onyeisiala Buhari nta vootu.
Onyeisi ha bụ Harry Oranezi kwuru n'ozi owepụtara kwuru na nke a megidere ebumnobi ndị Igbo gbaa gburugburu.
Anyị achọpụtala ndị ozi Boko Haram - Ndịagha Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Ndịagha Naịjirịa ekwuola na ụfọdụ ndị na-ere nkụ na Borno Steeti na-enyere ndị Boko Haram aka site n'izigara ha nri, ọgwụ mmanụ ụgbọala na ihe ndị ọzọ eji ebi ndụ.
Onye ndu ndị nke ngalaba 7 Division bụ Brig. Gen Bulama Biu kwuru nke a mgbe ọ na-azụ ajụjụ banyere mmachi ha machiri ndị na-ere nkụ n'ogbe ahụ.
N'ofesi

Ebe foto si, Reuters
Ihe ruru mmadụ anọ anwụola site na mgbawa mmansụ gaasị bụ nke mere n'etiti obodo Paris dịka ndị ọrụ gbatagbata chọpụtara ozu otu nwaanyị.
Ọkụ ọgbụgba a gbukwara ndị na-agbanyụ ọkụ mmadụ abụọ ebe ọtụtụ merụrụ ahụ gụnyere okporoụzọ na ngwongwo lara n'iyi.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Nkeji
Ihe nkiri taa
N'ofesi,

Ebe foto si, Reuters
Aka na-achị South Afirika bụ Cyril Ramaphosa arịọla ụmụnwoke ka ha jịkọta aka kwụsị oke mmetọ ahụ na-eme na mba ahụ makana ọ bụrụla nnukwu nsogbu.
Ebe,

Ebe foto si, AFP
Odee akwụkwọ Mba U.S bụ Mike Pompeo kwuru na a ga-enweli nkwekọrịta n'etiti Amerika
na Turkey iji wee chekwa ndị ọgụ Kurdish na-alụ ọgụ na Syria ka Amerika pụchara na mba ahụ.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Asọmpi Naịjirịa Professional Football League ga-amalite taa bụ Janụary iri na atọ, 2019.
Kwara united ga-ezute Sunshine stars ebe MFM fc ga-ezute Eyimba FC n'ọgbọ egwuregwu ọhụrụ Eyimba dị n'Aba.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Nkeji nke taa











