A ga-akwụgbu onye nkuzi 'pịagburu' nwata akwụkwọ
Akụkọ dị mkpa:
Na mba Tanzanịa, a ga-eji ụdọ akwụgbu onye nkuzi tiri otu nwataakwụkwọ ya ihe tinka kụrụ pan, mere ka ihe mgbu o nwetara n'otiti ahụ gbuo ya.

Ebe foto si, Getty Images
Onye nkuzi ahụ dị afọ iri ise na otu, boro nwata ahụ dị afọ iri na anọ ebubo izu akpa otu onye nkuzi.
N'agbanyeghi na ntaramahụhụ dịka ịkwụ mmadụ ụdọ ma o mete ihe e ji eme ya dị ire na mba Tanzanịa, nke a ga-eme ya mbụ a ga-eme ya mmadụ kemgbe 1994 e mere ya ikpeazụ.
Uche Nwosu ọ na-azọ ka ọ naghị azọ?
Ọnụ na-ekwuchitere Uche Nwosu bụ Onwuasoanya FCC Jones, ekwuola na akụkọ na-efegharị na Nwosu agaghị eso azọ oche gọvanọ n'Imo steeti, bụ akụkọ ụgha.

Gụọ ya n'uju ebe a: Akwapụla Uche Nwosu ịzọ ọkwa gọvanọ na Satọde ?
A na-agbazị egbe n'Imo?
Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ndị Ojiegbe a na-amaghị ndị ha bụ agbaala onye na-achụrụ Emeka Ihedioha bụ onye na-azọ ọkwa gọvanọ n'okpuru pati PDP n'Imo steeti nta vootu, egbe.

Ebe foto si, Eze Ugochukwu
Dịka anya hụrụ ka o si mee bụ Eze Ugochukwu gwara BBC Igbo, nwaamadị a bụ Nsorom Nnamdi, natara ọnụ egbe abụọ site n'aka ndị Ojiegbe a bụ ụmụokorobịa abụọ ji ogbatumtum.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Egbe agbawala n'Imo steeti
N'egwuregwu,
A ga-anụ ụzụ Chelsea, Arsenal, Inter Milan, Sevilla, Valencia, Dynamo Kiev, Benfica, Napoli na ndị ọzọ, na mgbede a mgbe Europa League malitere.
Ọ bụ Lukaku nyere Manchester United goolu nke mbụ n'asompi ha na PSG mere n'abalị Wenezde ngwagwa e bidochara asompi ahụ na ntabianya 111.

Ebe foto si, Getty Images
Lukaku mechara nyekwa goolu nke abụọ ya ka n'oge agba nke abụọ.
Cheta na PSG gbaburu Man.U ọkpụ abụọ n' ụlọ ha izuatọ atọ gara gara a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Mana Manchester United mere PSG 'ọgbara Igbo gharịị' n'ụlọ ebe ha dịka ha ji ọkpụ atọ a satara otu merie ha
Ọ bụ Marcus Rashford gbara penarịtị nyere goolu gbakara netị nke ndị PSG nke tiri Neymar e cheta ebewe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Neymar Da Silva Santos onye gosiri iwe ya na soshal midia kwuru n' igwe Instagram ya na penarịtị a gbara ha abụghị ya mana o mechara wepụ ozi ahụ.
Election 2019: Atiku enwetala ikike ịnyocha akụrụngwa Inec

Ebe foto si, @Atiku/Twitter
Atiku Abubakar nke PDP emeriela agba nke mbụ dịka ụlọikpe ehiwere gbasara ntuliaka nọrọ nye Inec iwu ka ha nye ya na otu PDP ikike inyocha akwụkwọ na akọrọngwa ntuliaka ọkwa onyeisiala nke a mere n' abalị iri abụọ na atọ ọnwa Febụwarị afọ 2019.
Mana na mkpebi ha n'Abuja ụbọchị Wenezde, ndị ọkaikpe atọ lekọtara okwu ahụ bụ Abdul Aboki, Peter Ige nakwa Emmanuel Agim ekweghị ka o mee nyocha pụrụ iche na ya bụ akọrọnwga "ugbua".
Ihe ndị e nyere ha ikike ilebanye anya gụnyere igwe "card reader",akwụkwọ ndekọ nakwa ndị ọzọ.
Ọzọ,
Onyeisi Inec na Imo bụ ọkammụta Francis Ezeonu ebola ebubo na ndị ọrụ ngo Inec n' Imo na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị kpakọrọ nkata wụnye aja na garị na ntuliaka ọkwa onyesisiala nakwa nke ụlọoimeiwu titi e mere.
Lee akụko yiri ya ebe a.
Na mba ofesi,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ụlọọrụ mba China na-emepụta ekwentị bụ Huawei agbaala gọọmenti mba Amerịka akwụkwọ maka ịmabido ngwa ahịa ha dịka Amerịka na-ebo ha ebubo inyo ndị mba ha n'ụzọ ezịghị ezi.

Ebe foto si, Getty Images









