Election 2019: A gbaala onye na-achuru Emeka Ihedioha nta vootu egbe

PDP

Ebe foto si, Eze Ugochukwu

Ndị Ojiegbe a na-amaghị ndị ha bụ agbaala onye na-achụrụ Emeka Ihedioha nta vootu, egbe.Dịka anya hụrụ ka o si mee bụ Eze Ugochukwu gwara BBC Igbo, nwaamadị a bụ Nsorom Nnamdi, natara ọnụ egbe abụọ site n'aka ndị Ojiegbe a bụ ụmụokorobịa abụọ ji ogbatumtum.

Ọ kwuru na Nsorom na-achụrụ Ihedioha na-azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti n'okpuru pati PDP vootu n'okpuruọchịchị Isu, zutere ihe mberede a oge ọ na-achọ ịbata n'ụlọ onye ji aha otu Pati PDP zọọ ọkwa Sineti n'Ọlụ zone .

Eze gwakwara BBC Igbo na akpọrọla Nsorom Nnamdi gawa n'ogbe gbata-gbata nke ụlọọgwụ Federal Medical Center dị n'Owere.

Emeka Ihedioha

Mbọ onye ntaakụkọ BBC Igbo gbara ịnụ olu onye na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu, kụrụ afọ n'ala, ebe o kwuru na ya nọ ebe ọ na-enwe nzukọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: