Anambra Killings: Ndị ohi akarịala ndị ọrụ nchekwa ike?

N'ime otu ọnwa gara aga, ndị ajọ mmadụ egbuola ọtụtụ mmadụ na-emeghi nta na-emeghi imo.
Ọ bụghị ndị ntọ, ọ bụru ndị ohi maọbụ ndị ọchị ehi, nke mere ọtụtụ mmadụ jizi chịrị obi n'aka.
Nke a bụ ụfọdụ mkpamkpa ndị a kpagoro na Naịjirịa:
Enugwu

Nke gbara ọtụtụ mmadụ anyammiri n'izu gara aga bụ nke ndị ntọ gburu otu ụkọchukwu bụ Fada Clement Ugwu na parishi ya n'Enugwu steeti.
Ndị uweojii jidekwara ndị omekome kwuru na aka ha dị na ntọrị fada ọzọ bụ nke ha egbughi.

Ka a na-ekwu nke a na-ekwu, BBC nwetere akụkọ maka nwaanyị nọọsụ aha ya bụ Maria Amadi, bụ onye rụrụ ọrụ na Federal Psychiatric Hospital Enugwu, bụ nke ndị oji egbe ezu napụrụ ndụ ya n'ike n'ihu ụlọ ya na Trans Ekulu Engwu.
Ka ọ dị ka nke ahụ ezughị, ndị ogbu ara ọbara wakporo nwagbọghọ si Abuja lọta be nna ya n'Enugwu Ezike, Enugwu steeti, ịbịa kwado ule JAMB.
A hụrụ ozu Ngozi Eze ebe ọ tọgbọrọ ka abalị abụọ achọwara ya gachara.
Gịnị ka ndị ọrụ nchekwa mere?
Ebere Amarizu bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu sị na ha ka na-ama imi n'ala ịmata ndị aka ha dị na mkpamkpa ndị a.

Ebe foto si, Mohammed Haruna
Anambara
N'izu gara aga ka ndị eche na ha bụ ndị ọchị ehi wakporo ma gbuo mmadụ ndị ọrụugbo n'Anam dị n'Anambara West.
Ugbua, uweojii sị na ha edunyele ndị ọrụ ha n'akụkọ ahụ maka nchekwa pụrụ iche.
Legọs
N'otu izuụka a gara aga, ka ndị ntọ tọọrọ onyeisi ndị ọrụ na-agbanyụ ọkụ akpọro Fire Service bụ Rasaki Musibau na mmadụ asaa ndị ọzọ n'anya ọcha n'ụzọ Epe na-aga Itokin na Legọs.

Ebe foto si, facebook.com/Lagos-State-Fire-Service
Gịnị ka ndị ọrụ nchekwa mere?
Ka ọ dị ugbua, ndị uwe ojii ekwupụtala na atọhapụla Musibau na mmadụ isii ndị a tọọrọ ya na ha n'ụbọchị Satọde abalị isii n'afọ Epreel mana a sị na e nwebeghi onye ha gidere maka ntọ a n'ihi na a ka na-alụsị ha ọgụ mgbe onye nta akụkọ BBC kpọrọ ha.
O kwukwara na o nweghi otu n'ime ha emerụrụ ahụ.
Mana ha ka na-emebanye nchọpụta maka ya.

Ebe foto si, Ahmed Sani
Kaduna
N'Ungwan Aku, Kajuru dị na Kaduna steeti, ka ndị eche na ha bụ ndị ọchị ehi gburu mmadụ iri abụọ ma merụọ ọtụtụ ahụ mgbe ha wakporo ndị obodo ahụ.
Nke a mere n'elekere asaa nke ụbọchị Mọnde, bụ ụbọchị asatọ nke ọnwa Epreelụ.
Kemgbe mbido afọ a, ndị mgbuisi edulaala ihe karịrị mmadụ 66 na Kajuru.
Ogbugbu na ntọrị ndị omekome na-eme na Kaduna steeti emeela ka ime njem okporoụzọ si Abuja gawa Kaduna ugbua dị ka ịga be mmụọ gụta ọkụ.
Zamfara

Oteela aka ugbua ndị Zamfara kwụsịrị imechi anya abụọ rahụ ụra maka ike ndị amakekwu na-akpa na be ha.
Agbanyeghị na BBC amaghị mmadụ ole lagoro mmuo na steeti ahụ, otu onye bi ebe ahụ sị na ihe dịka mmadụ 250 anwụọla n'aka ndị ntọ maọbụ ndị Fulani na-achị ehi.
Gịnị ka gọọmentị mere?
Gọọmentị etiti sị na ya akwụsịla ọrụ igwuputa nnatarachi dị n'ala na steeti ahụ bụ nke ha sị na o so awụnye mmanụ na ya bụ ọkụ.
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari dere n'akara Twitter ya sị:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Onyeisi ndị uweojii na Zamfara bụ Mohammed Adamu sị na ha kwadosiri "Operation Puff Adder" maka ibuso ndị ọjọọ a agha ike.

Ebe foto si, Ahmed Sani
Rivers steeti
Na Mgbuo-Odohia, Rumuolumeni dị n'okpuru ọchịchị Obio Akpor, ka mmadụ asatọ lara mmụọ n'aka ndị otu nzuzo na-akpa mkpamkpa n'ogbe ahụ.
Gịnị ka ndị ọrụ nchekwa na-eme?
Agbanyeghị na ndị uweojii juru ebe ahụ ugbua na-etinye anya ịmata ebe mmiri si banye opi ụgbọghụrụ, ọtụtụ ndị bi n'ogbe ahụ agbafuchaala ghara ụlọ ahịa ha na ọrụ ha.

Ondo steeti

Ebe foto si, The Nation Online
Nke kpọtụrụ ụbọchị Monde, ụbọchị asatọ nke ọnwa Epreelụ, bụ ndị oji egbe ezu wakporo ụlọakụ First Bank dị n'Ido Ani, n'okpuru ọchịchị Ose, Ondo Steeti, gaa gbaa ndị mmadụ gwogwo, ma were ogbunigwe gbawaa ụlọakụ ahụ buru ego gbalaga.
Ihe karịrị mmadụ isii nwụrụ na ya bụ mwakpo nke gụnyere onye uweojii, osote onyeisi n'Ido Ani Grammar School nakwa ndị ọrụ ụlọakụ ahụ.
Gịnị ka ndị ọrụ nchekwa mere?
Ha kwuru na ha ka na-etinye anya na ya.








