Zamfara: E gbuola mmadụ 60

Ebe foto si, AFP
Ndị bi n'ime obodo dị na steeti Zamfara n'ndịda ugwu Naijiria gwara BBC na ihe karịrị mmadụ iri isii bụ ihe e gburu ebe ọtụtụ ndị mmadụ ka na-efu efu ka ndị na-ezu ohi ehu nke a kpọrọ cattle rustling na bekee n'abali abụọ n'usoro.
Ndị uweojii kwetara na mwakpo ahu mere n'eziokwu mana ha kwuru na ọ bụ ozu mmadụ atọ ka ha nwetara.
Ka nke a na-eme, ndịagha ala Naijiria akwala mmadụ iri na otu ndị e chere na ha bụ ndị ozuu ehi ahụ gburu na Kaduna steeti na mbido ọnwa.
Akụkọ ga-amasi gi:





