Na Zamfara steeti, ọgụ erịala isi mmadụ 35

Ebe foto si, @NPF
Mana ndị uwe ojii na Zamfara steeti na-ekwu na ndị bu egbe gbagburu mmadụ iri na asatọ n' obodo ahụ ụnyaahụ mgbe ndị nta na ndị na-ọchị ehi bidoro ọgụ n'ime ohia.
N'ozi mgbasa ozi nke Gọvanọ Abubakar wepụtara, ọ katọrọ mkpamkpa nke ndị omekome, ma nye ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha mee gbanụgbanụ nwụchie ndị mere mpụ ahụ.
O kwuru na nsogbu nchekwa na-emetụta akụnaụba nke ga-akwalite steeti ahụ, n'ihi na e nweghị udo, oganihu agaghị adị.
Ọ gara n'ihu tie ndị ezinaụlọ ndị e gburu na ndị merụrụ ahụ aka n'obi, ma rịọ Allah ka o nye ndị nwuru anwụ udo.





