Ndị uweojii anwụchiela mmadụ atọ maka mwakpo emere na Zamfara

ọtụtụ ndị uweoji n'elụ ụgbọ agha ha

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị uweoji ebidola nyocha ihe gara na Zamfara steetị

Akụkọ na-apụta site Zamfara steeti na-ekwu na ndị uweojii nke Naịjria awuchiela mmadụ atọ echere na ha sonyere na mwakpo gburu ndị mmadu na Zamfara steeti.

Enyere aha ha ka: Halilu Garba nke a na-etu 'Mabushi', Zubairu Marafa nke eji 'Wakili' mala na Nafiu' Badamosi nke bụ 'Zakiru'.

Moshood Jimoh nke na-ekwuchitere ndị uweojii na Naịjirịa kwuru na ndị a na-enye ndị uweojii aka na nyocha ha na-eme.

Nke a pụtara ka onyeisi ndị uweojii zipụrụ ngalaba ọhụrụ atọ maka inyere aka kwado udo na nchekwa n'ime obodo Birane.

Ụmụ nwaanyị atọ yi akwa ụjụ

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Echere na mwakpo ahụ gburu ihe ruru mmadụ iri n'anọ bụ ndị n'ezu ohi ehi mere ya

Ndị uweojii sị na ha ga-aga ụlọịkpe ma nyocha ha na-eme ugbua gwụcha.