Champions League: Tottenham apịawaala Manchester City azụ ka Liverpool rachara pịọm n'ahụ Porto

Ebe foto si, AFP
Tottenham dị ọkụ ka ha zutere Manchester City ụnyaahụ n'asọmpị ndị eze bụ UEFA Champions League
Ọ bụ asọmpị nke abụọ Tottenham Hotspur ga-agba n'ama egwuregwu ọhụrụ ha dịka Son Heung-min mekwara ka onye chụrụ aja goolu na ya bụ ama ka anatara goolu nke abuọ ya ebe ahụ.
Tottenham nwetere mmerị n'asọmpị a ka ọ fọrọ nkeji iri na abụọ ka agbacha, agbanyeghi na onye egwu Man City bụ Fabian Delph ji ọkpa ike zọpụ onye ndu ha bụ Harry Kane na ya bu asọmpị.

Ebe foto si, Getty Images
Mmeri bịara makana Spurs tara akpụ n'asọmpị a, dịka Man City riri Penaliti enyere ha ma gbakwa ka ndị umengwu karịrị n'ahụ.
Ha nwere ohere ịwụ agada nọchịrị ha ụzọ ha ga-eji merie iko a n'ụbọchị nke iri na asaa nke ọnwa April a mgbe ha nabatara Spurs na be ha.

Ebe foto si, Getty Images
Liverpool ji otu, abụọ sị Porto anyị adịghị achị
N'Anfield, ọkwa so ọchị ọchị dị n'ihu ndi egwuregwu Liverpool ka ha kwachara ogbo ha bụ FC Porto ọbịa.
Roberto Firmino na Naby Keita bu ndị dere aha ha na goolu abụọ Liverpool ji gba ọchụ n'asọmpị a.
Porto gbara mbọ inye goolu nke ha mana onye goolu ha bụ Moussa Marega ahụghị ebe o dobere ụkwụ oji enye goolu n'asọmpị a.
N'afọ 2018, ọ bụ goolu ise ka Liverpool jiri nụọ Porto n'ụzọ ibute iko a na-ese okwu, nke bụ na akwụkwọ na-enye ha mmasị imere mgbe ha zutere na be Porto n'ụbọchị iri asaa nke ọnwa April 2019.

Ebe foto si, EPA










